You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ntorobịa Naịjirịa amaala Buhari aka maka ịkpọ ha 'ndị umengwụ'
Ndị mmadụ ka na-etinye ọnụ n'okwu gbasara 'umengwụ' onyeisiala Naịjirịa kpọrọ ndị ntorobịa.
Ka Buhari gara London maka nzukọ ndị ọchịchị mba ndị nọ n'okpuru Commonwealth nke a kpọrọ CHOGM, o kwuru na ndị ntorobịa Naịjirịa dị umengwụ.
Okwu a o kwuru atọghị ọtụtụ ndị Naịjirịa ọchị, nke kpatara ha jiri gosi iwe ha n'elu sosha midia.
Onye na-ekwuchitere ọnụ Buhari bụ Femi Adesina, kwuru na ndị Naịjirịa ghọtaghiere ihe o kwuru.
Ihe Adesina kwuru akwụsịghị ndị mmadụ ikwu ihe dị ha n'obi.
"#LazyNigerianYouths" na-ewu
Ọtụtụ n'ime ha gara n'ihu bido igosipụta ọrụ aka ha, ma na-ekwu na ha abụghị ndị umengwụ n'agbanyeghị na ala Naịjirịa adịchaghị mma.
Otu onye ọcha tinyere ọnụ ya n'okwu a.
Ụfọdụ kwuru etu ha si jiri aka ha zụọ onwe ha n'ụlọakwụkwọ site na mbọ ha na-agba.
Ụfọdụ kwuru na ha agaghị ebinyere Buhari aka n'afọ 2019
Otu onye ji okwu njakịrị gosi onye nwere ọrụsị ka na-eji ya arụ ọrụ