You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Iwe okwu Buhari na-ewe ndị ntorobịa
Ndị ntorobịa Naijiria gosiri iwe ha n'ihe onyeisiala bụ Muhammadu Buhari kwuru n'ọgbakọ Commonwealth e nwere na Westminister, Lọndọn, ụbọchị Wenesde ebe o kwuru na ndị ntorobịa Naijiria adịghị ike ọrụ.
Buhari sị: "Pasentị iri isii n'ime mmadụ dị nde 180 n'ọnụọgụgụ, erubeghị afọ iri atọ ọtụtụ n'ime ha agabeghị akwụkwọ, ha na-ekwu na Naijiria bụ mba na-emepụta mmanụ ya mere na ha ga-etukwuru ala na enweghị ihe ha na-eme, ma na enweta ebe obibi, nleta ahụike na agụmakwụkwọ na-e akwụghị ego ọbụla."
Mana okwu ahụ kpasuru ọtụtụ ndị ntorobịa iwe nke ha kwuputara na soshal midia.
Onye na-eme ihe nkiri ma bụrụkwa onye zọrọ ọkwa gọvanọ nke Anambra steeti bụ Yul Edochie, sara onyeisiala na Twitter sị: "Anyị adịghị umengwụ."
Onye ọzọ kpọrọ onwe ya, Maazị Jack Robinson, kwuru na "dịka onye ntorobia Naijiria gbalahụrụ ọnwụ erughị eru ka a mụrụ ya n'obodo kachasi dị egwu n'ụwa, ebe ụgwọọnwa opekampe a na-akwụ onyeọrụ bụ dọla iri isii ($60), na-enye onwe ya mmiri, na-enye onwe ya ọkụ, na enweghị nchekwa ahụike, ụgwọ ị ga-akwụ ya abụrụ ịgwa mbaụwa na ọ dị umengwụ".
Ebe Jackson Ude kwuru na ọ bụ ihe ihere na onyeisiala Buharị, onye o kwuru na onyenwughị ndị ntọrọbia ọrụ, gwara ọgbakọ Commonwealth na ọtụtụ ndị ntorobịa Naijiria dị umengwụ.
Kelly kwuru na ọ dị ezigbo njọ na Buhari kpọrọ ndị ntorobịa ndị ụmengwụ n'ihi na dịka o si kwuo, ndị mba ọzọ maara na ndị ntorobịa Naịjirịa dị ike ọrụ.