Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a : Prince Harry na Lọọlọ ya ekelele ụwa

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:

Prince Harry na Lolo Meghan ekelele uwa maka nkwado

N'ofesi, Prince Harry na Lolo ya bụ Meghan ekelela uwa maka nkwado n'agbam akwụkwọ ha ụnyahụ.

Prince Harry na Lolo ya bunyere ụkpa ekele a n'abalị mgbe ndị ọbịa pụrụ iche gara meme a n'akụ ngaji n'eze nke bụ emụme ha jiri wete agbam akwụkwọ ahụ na-jedebe.

Ndị otu Okorocha azachiele ndị otu TOE Ekechị

Onye nnukwu ojeozi Govanor Imo Steeti n'ihe gbasara mgbasaozi soshal media bụ Ebere Nzewuji akatọla ọkwụ otu APC Imo nke TOE Ekechi nọ na isi ya.

Chioma:Ebere is na ọ bụ egwụ Uche Nwosu jị ndị otu ahụ maka na ha ma na ha agaghị ahụ azụ ya anya ma emegharị ntụilaka nke imeụlọ ndị APC mere na steeti ahụ

PDP ebola APC ebubo mkpagbu

N'aka ọzọ, ndị otu PDP etiela mkpu na-ebo ndị Pati APC ebubo ikpachi ndị Pati ọzọ ọnụ bụ ndị na-ekwetaghị na ha site na ịjide, ị tụha mkpọrọ maọbụ memi na ha.

Onye kwuru nke a bụ ode akwụkwọ mgbasa ozị ndị otu a bụ Kola Ologbondiyan mgbe ọ gwara ndị nta akụkọ okwu ụnyahụ n'Abuja.

Onwebeghị ihe ndị APC sara gbasara nke a ka ọdị ụgbụa.

Chelsea eburula iko Emirate

N'egwuruegwu, Chelsea ewerela otu ọkpụ maburu iko Emirate FA agbabiri ụnyahụ.

Ebe Jose Mourinho bụ onyenkuzi ndị Manchester United n'ekwe ha n'aka maka mmerie a, ọ sị na Chelsea ekwesịghị ị bụ ya bụ iko site na ka ha sịrị sọ ya bụ mpi.

Gee ya na nkeji nke ututu a:

Lee ihe nkiri taa