You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Meghan Markle Baby: Ọ bụ nwa nwoke!
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na Meghan Markle abụrụla nne dịka ọ nwụrụ nwa nwoke.
Ọ mụrụ nwa ya n'ehihie ụbọchị Monde bụ 6 nke ọnwa Mee.
Ọkparaeze Harry gosiri obi aṅụrị ya site n'ozi ọ gbasara n'akara Instagram ya:
Ihe ị maghị maka ọkparaeze ọhụrụ a mụrụ:
- A mụrụ ya n'elekere ise nke ụzụ ụtụtụ (5:26am) n'ụbọchị Monde 6 nke ọnwa Mee.
- Ọ na-ada 7lbs 3oz ya bụ 3.2kg.
- Ọ ga-abụ mmadụ asaa nọ n'ụzọ oche eze mba Briten.
- Ọ bụ nwanwa asatọ nke Ezenwaanyị Elizabeth na mba Briten.
"Obi dị anyị aṅụrị, ihe a bụ ihe ịtụ anya m hụrụ na ndụ m" ka Ọkparaeze Harry gwara BBC.
O kwukwara na ọ ga-agbasa ozi ọzọ n'ụbochị abụọ na-abịa ka mmadụ niile nwee ohere hụ nwa ọhụrụ ahụ.