Witchcraft Conference ga-aga n'ihu na mahadum na UNN

Ebe foto si, B.I.C Ijeomah
Ọgbakọ mmụta ngalaba akọpọrọ "B.I. Ijeomah Centre for Policy Studies and Research" na-achọ ikpọkọba na Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka na-ewu ewu kemgbe maka ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya.
Ụfọdọ na-ekwu na ya bụ ọgbakọ ekwesighị ịpụta ihe maka na ọ bụ ọgbakọ ndị 'amusu'.
Ndị ọzọ ka a nụrụ na ha achọghị ka ya bụ ọgbakọ pụta ihe maka na ọ nwereike ịgba agwa ndị amusu n'anwụ n'ụzọ ga-emebiri ha ihe.
Nke dị na soshal midia kemgbe ụnyahụ bụ na ya bụ ọgbakọ akpụọla afọ n'ala. Mana nke ahụ bụ ezigbo asị dị ka otu onye ọkankuzi Nsukka so ekpokoba ya bụ ọgbakọ achọghị ka akpọ aha ya siri kwuo.
Ọ sị na ya bụ ọgbakọ ka ga-amalite ụbọchị Wenezde ọzọ bụ 26 na 27 nke 2019 dịka akara ya.
Ya bụ ọkankuzi sị na "ọ bụ ndị amusu na-atụ egwu na ya bụ ọgbakọ ga-agba ha n'anwụ bụ ndị na-etinyere ha ọkpa n'azụ".
O kwukwara na ihe niile ahụ dị na soshal midia bụ okpokoto asi, ma sịkwa na ya bụ ọgbakọ ka ga-aga n'ihu.
Chidi Ugwu bụ onye sokwa na kọmiti na-kpokoba ya bụ ọgbakọ sị na ya bụ ọgbakọ bụ maka ịme ka ndị mmadụ mata ihe gbasara amusu.
N'onu Chidi, "ọtụtụ mmadụ na-eche na ọ bụ amusu na-enye ha nsogbu ma ha nwee ọgbatughị ebụla".
Ọ sị na ọgbakọ a ga-eme ka ndị mmadụ ghọta nke bụ eziokwu.
Agbanyeghị, Chidi sị na mahadum na-ekwu ka ndị na-ekpokoba ya bụ ọgbakọ kpatu aha ya bu ọgbakọ aka ka ndị mmadụ ghara ighọtahiezi ya.
Chidi kwukwara na ọtụtụ mmadụ egosila masị na ịbịa ya bụ ọgbakọ nke bụ na ha ebugharịala ọnọdụ ebe a chọrọ ịme ya mbụ, bugazia ha ebe ga-abata ọtụtụ mmadụ.










