France: Ụmụnwaanyi ahụsiela anya n'aka ndị ụtọ ha

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ụmụnwaanyị ahụsiela anya na France

Nwaanyi na-eru uju na France

Ebe foto si, AFP

Ọzọ, echi bụ Satọde ka ụmụ nwaanyị ga-eme ngagharịwe na mba France maka oke igbuilu na ogbugbu ụmụnwoke na-egbu ha na mba ahụ.

Ihe ruru ụmụnwaanyị otu narị, iri atọ na asaa anwụọla n'aka ndị ụtọ ha n'afọ 2019, dịka akụkọ kwuru.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Mba ahụ ga-enwe ọgbakọ maka itinye ọnụ n'okwu gbasara igbu ụmụnwaanyi ọkachasị n'aka ndị ụtọ ha.

N'afọ gara aga ụmụnwaanyị 121 nwụrụ n'aka ndị ụtọ ha.

Akụkọ ọzọ kwukwara na ihe ruru 217 bụ ụmụnwaanyị gburu onwe ha maka ihe ha na-agabiga n'aka ụmụnwoke ha n'ezinụlọ.

Nke afọ a ka njo, nke bụ na isi ụmụnwaanyị dị 137 alaala maka tigbuo zọgbuo dị na ezinụlọ.

Kọmishona nlekọta gburu anwụọla n'Imo steeti

Nne na-ebe akwa

Ebe foto si, AFP

Akụkọ na-eru anyị ntị bụ na Kọmishona na ahụ maka ọdịmma ugburu nakwa ọnatarachi n'Imo steeti bụ Anthony Okeke a laala mmụọ ụnyahụ.

Onye enyemaka pụrụichi Gọvanọ steeti ahụ bụ Mazi Ali Friday gwara BBC Igbo nke a.

Ndị akpụobi achụsaala ndị gaara Oshiomhole ngagharịiwe

Adams Oshiomhole

Ebe foto si, Adams Oshiomhole facebook

Nke na-akpọtụ taa bụ na ndị akpụobi achuola ndị mere ngagharịiwe maka ichutu Adam Oshiomhole nke APC n'ọkwa ọsọ ụkwụeru ala.

Mana ka akụkọ ka na-aga, ndị isi APC ekwuola na ha ga-ehibe kọmiti ga-ekpe udo, maka nsogbu niile ha na-enwegasị dịka odee akwụkwọ ha ziterela anyị.

Abubakar Alihu bụ onye so na ndị were ya bụ ngaghịiwe sị na ụzọ ha chọrọ iji gosi iwe ha maka ọchịchị ya bụ onyeisi nke ha sị na ọ dịghị mma.

Gee akụkọ anyị n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

bgw emeriela n'ụlọikpe

Ọbọgwụ

Ebe foto si, Reuters

Ọbọgwụ ndị na-akpa ụrị na otu obodo akpọrọ Dax na mba Frans enwetela ikike ịme mkpọtụ dịka anụmanụ ha bụ ka ulọikpe gbajọrọ arịrịọ otu onye bi na obodo ahu rịọrọ ya.

Ọ bụ n'ụbọchị Tusde ka ụlọikpe a kpebiri na mkpesa onye agbataobi ọbọgwụ ndị a na mkpọtụ ha na-enye ndụ ya nsogbu.

Dịka ụlọ ntaakụkọ Reuters siri kwuo, ọbọgwụ ndị a ruru iri isii bi na be otu nwoke aha ya bụ Dominique Douthe bi n'agada ugwu Pyrenees dị n'ime ime obodo na mba Frans.

"Ọbọgwụ emeriela," bụ ihe Douthe gwara ndị ntaakụkọ Reuthers ma gaa n'ihu kwuo na obi dị ya ezigbote ụtọ maka na ọ chọchị "igbu ọbọgwụ ya."

Onye wegara mkpesa n'ụlọikpe bụ onye si obodo mepere emepe bịa biri n'ime obodo ahụ.

Mkpesa bu ọzọ n'ime ọtụtụ mkpesa na-apụta ka ndị mmadu si obodo mepere emepe abịa ime obodo.

N'ọnwa Sepụtemba, otu dịọkpa aha bu Maurice nwetere ikike n'ụlọikpe ịga n'ihu eti kokoroko ya dịka ọkụkọ ọ bụ.

Ndị wegakwara mkpesa maka Maurice sikwa obodo mepere emepe bịa ime obodo akpọrọ Soustons.

Aknaụba Naịjirịa arịara n'ọkara ato nke 2019

ahịa osikapa na nrị mkpụrụ ibe ya

Ebe foto si, AFP

ngalaba na-ahụ maka mgbakọ a kpọrọ National Bureau of Statistics, na-akọwa na akụnaụba Naịjirịa ji pacenti abụọ n'ọkara gbagote elu n'ime ọnwa atọ.

Ihe a bụ mbụ akụnaụba Naịjirịa gbagotere karịa ihe ruru otu pacenti otu n'afọ 2019.

Ọ bụ ọrịrị ego mmanụ agbịdị n'ahịa mba ụwa nyere aka na mbunyi akụnaụba a

Evu agbagbuola mmadu atọ n'Indonesia

Evu

N'ime izuụka abụo gara aga evu egbuola mmadụ atọ na mba Indonesia.

Otu nwata akwụkwọ di afọ iri na otu nwụrụ na mpaghara West Java dịka ya na ndị enyi ya atọ gara itisa ụlọ ọvụvụ.

Nke a na-abịa ka ndị agadị abụọ nwụrụ na Obodo Klaten, na mba ahụ.

Ganduje akpọọla ekwe nkụ n'ikpe chuturu ndị Emir anọ o hiwere

Gọvanọ Abdullah Ganduje nke Kano

Ebe foto si, FACEBOOK/KANO STATE GOVT

Gọọmentị steeti Kano sị na agbanyeghi nkụsa ụlọikpe kụsara ndị Emir anọ ha hiwere na ọ ga-aga n'ihu na-ahụta ha dịka ndị Emir.

Gọvanọ Abdullahi Ganduje onye kwuru nke a site n'ọnụ komishọna mgbasaozi ya bụ Muhammad Garba sị na ha ka na-enyocha ikpe ahụ.

Ndị obodo anọ nke ụlọikpe kachapụrụ oche eze ọdịnala ha gụnyere Bichi, Rano, Karaye na Gaya.

Ọ sị na gọọmentị agaghị anọ chịkọta aka abụọ ka ụdịrị ikike a ọchịchị mebie ọ dị mma na mmepe nke steeti ya.

Gọọmentị sị ka ndị mmadụ bi na Kano dere jụụ ruo mgbe ha ga-eme mkpebi ọhụrụ.

Ndị uweojii agbawala ogbunigwe n'Anambra

Obodo Konduga

Ebe foto si, Getty Images

Uweojii Anambara sị na ha agbawala ogbunigwe eji lụọ agha Bịafra ndị na-arụ ụlọ gwuputere n'Ọka.

Ọnu an-ekwuru uweojii n'Anambara bụ Haruna Mohammed si na agbanyeghị na ogbunigwe a agbaghi mgbe a na-egwupute ya, ọ ka dị ezigbote ire.

Aka m dị ọcha - Gracious David West

Kọmịshọna ndị uweojii Rịvas steeti na ndị na-eme ngagharịiwe maka ogbugbu ụmụagbọghọ

I chetere akụkọ Nwokoroọbịa ahụ a sị na-egbu ụmụagbọghọ n'ụlọ ndịna na Portharcourt?

Ọ kwa nke kwetere na aka ya dị n'ogbugbu ha?

Eeeh! mana ọ pụtara n'ụlọikpe ụnyaahụ gọọ na ụkwụ na aka adịghị zi n'ọnwụ ụmụagbọghọ ahụ, sị ka ndị uweojii weta ihe akaebe.

N'ofesi

Ndị na-eme ngagharịiwe n'Izrel

Ebe foto si, EPA

Praịm minista mba Izrel bụ Benjamin Netanyanhu aṅụọla iyi i ji si ọchịchị ya ike n'agbanyeghi ebubo iri ngarị na mpụ e boro ya.

N'egwuregwu

Pochettino

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Pochettino nọrọ afọ ise dịka onye nchịkọta/nkuzi Tottenham

Mauricio Pochettino bụ onye Tottenham chụrụ achụ ekelela ndị otu ya n'ụzọ pụrụiche n'agbanyeghi na ọ hụghị ha tupu a chụọ ya.

Dịka o si dee ya n'ihu bọọdụ, ọ sịrị ha 'unu emeela, anyị agahị asị ka ọ dị maka na unu ga-anọ m n'obi n'oge niile'.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile