Constituency Project: Ihe ị kwesiri ịma maka ya

Okporoụzọ ọjọọ
Nkọwa foto, Okporoụzọ ọjọọ

Onyeisiala Muhamadu Buhari nkwuputere okwu tinyere ndị ụlọomeiwu na Naịjirịa n'agbagharịa taa bụ ụbọchị Nọvemba iri abụọ.

O kwuru na o nweghị ihe gbara ọkpụrụkpụ ndị ụlọomeiwu Naịjirịa jirila ego ruru otu tarị n'ụma(1 trillion plus) amapụtara maka "Constituency Projects" mepụta kamgbe afọ iri.

O kwuru nke a n'ọgbakọ otu 'Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission'(ICPC) nakwa gọọmenti etiti hibere nso nso a.

Mana ụfọdụ ndị mmadụ na-ajụ gịnịdị bụ "Constituency Projects" na-ese okwu?

Ifeanyi Olumba ọnụ na-eru n'okwu na ndọrọndọrọ ọchịchị kọwara na "Constituency Project" dịka achịcha a na-ekenye ndị na-anọchite steeti dị iche iche n'ụlọomeiwu ha wegara ndị ha na-anọchite.

O kwuru na 'achịcha a' na-abịa n'udi ụzọ, ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ zuruoke, ụlọ dị ọnụ ana wdgz.

Mana o kwuru na ọ na-agba ya anya mmiri ma ọ hụ ka ndị nnọchiteanya n'ụlọomeiwu na-enye ndị steeti ha akpa ọsikapa, wil baro, ọgba tum tum, akụrụngwa e ji adụ akwa wdgz.

Olumba kwuru na ihe ndị a enweghị isi.

Kedụ ka atụmaatụ a si emetụta ụmụ Naịjirịa?

  • O bụ oke nketa gị dịka ọchịchị onyekwuouche ya si nye
  • E kepụtara atụmaatụ ka ihe owu owu ruo steeti ọbụla aka na Naịjirịa
  • Ọ ga-eme ka ibi ndụ diri gị fecha fecha
  • Ọ ga-agbarịrị ọkpụrụkpụ, o kwesighị ịbụ ihe i ga-eri nyụpụ na nsị, o kwesiri ị tọ atọ

Ifeanyi Oluma gara n'ihu kwuo na ọ ga-adị mma ka onyeisiala gbaa n'anwụ ego niile e kenyere ndị ụlọomeiwu na-anọchite ogbe ha site n'afọ 1999 ruo ugbua.

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Di na nwunye mụrụ nwa ka afọ 17 gachara