WWE Crown Jewel: Taa ka Tyson Fury na Braun Strowman ga-achịpụ ya

Ebe foto si, Getty Images
Tyson Fury, dimkpa e ji iti ọkpọ mara n'ụwa niile, abanyela n'egwuregwu 'World Wrestling Entertainment'.
Taa bụ ụbọchị ikpeazụ nke ọnwa Ọktoba 2019 ka ya na Braun Strowman ga-ama dimkpa na ibe ya nke ka ike.
Strowman n'onwe ya bụkwa agadaga dimkpa okwu ya anaghị ekwe okwukwu.
Ọgụ a bụ n'obodo Riyad nke dị na mba Saudi Arabia ka ọ ga-eme na abalị taa.
Etu Fury si malite ịgba mgba

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ otu ụbọchị ebe Tyson Fury nọchapụrụ n'akụkụ na-ekiri mgba ka Strowman bịara chọọ ya okwu.
Nke a ekweghi Fury odidi, o wee malie elu chọọ ịga ọgụ, mana ndị mmadụ jituru ya.
N'ụbọchị ọzọ, Fury batara n'ogige ebe a na-agba mgba ma kwuo na Strowman ga-arịọ ya mgbaghara maka mkparị ọkparịrị ya.
Mana Stowman gwara ya na ọ kụọla aka na gwongworo bu akpa ntu.
Ha wee kabie na ha ga-achịpụ ya ka onye ọbụla mara onye karịrị ibe ya.
Fury ọ kwụsịla ịkụ ọkpọ?

Ebe foto si, Reuters
Ọ bụ eziokwu na Tyson banyere ịgba mgba nwa mgbe nta, ọ ka na-eti ọkpọ.
Ọgụ ikpeazụ ọ lụrụ bụ nke ya na Otoo Wallin n'ọnwa Sepụtemba.
A na-ele anya na Fury ga-ezute Deontay Wilder, onye bụ ọkaibe n'ịkụ ọkpọ n'ọnwa Febrụwarị afọ 2020.
Onye ọzọ si ịti ọkpọ bata ịgba mgba

Ebe foto si, Getty Images
Na 2008, Floyd Mayweather sikwa iti ọkpọ banye n'ịgba mgba.
Mayweather bụ onye ama ama ji iti ọkpọ baa nnukwu ọgaranya.
Ọgụ Mayweather na Big Show wuru ewu nke ukwu n'oge ahụ.
Na ya bụ ọgụ, Mayweather ji ọkpọ kụpụ Big Show mkpụrụ ọkwụrụ n'anya.
Nke a bụ n'agbanyeghị na Big Show bụ gbara nnukwu dịmkpa karịe ebe a tụkọtara ụdị Mayweather atọ.
Mana Igbo na-atụ ilu sị na ejighi ibu oke ibu anyụ nsị ukwu.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:










