Manchester United vs AZ Alkmaar: Ekwensu anya mmeemmee ndị Man utd abịala ha ụgwọ?

Manchester United

Ebe foto si, Getty Images

Onye ọbụla ga-eche na Manchester United ga-egwe ndị AZ Alkmaar ka ose e ji agwọ abacha.

Mana ọ tụrụ ọtụtụ na anya ka agbazụrụ ya bụ egwu bọọlụ, Manchester United gbara aka laa ka afọ ochie.

N'agbanyeghị Rashford na ndị agha ha niile, ya bụ Ekwensu anya mmemme bụ 'Red Devils' ndị Man Utd ji abamba, AZ Alkmaar gosiri ha na ha bụ ụkwa a chị n'aka, ọ na-agba.

Nke a bụ nke ugboro anọ Manchester United na-agba ọnyụpa.

Ole Gunnar Solskjaer

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ole Gunnar Solskjaer

Ole Gunnar Solskjaer bụ onye nkuzi ha na-ebo ya ahịhịa na ala ebe ha gbara ya bụ bọọlụ bụ nke ọ sị na "anya m ahụnubeghị ụdị nke ahụ mbụ".

Mana onye ga-ekwete ajambele nke a ebe ndị otu ha na-eri ohere niile ha nwere itinye goolu ọkacha nke Jesse Lingard riri n'ikpeazụ.

Chi ha zọrọ ha mgbe Myron Boadu nke AZ tinyere otu goolu na agba nke mbụ bụ nke akụchapụru.

Ekwensu anya mmeemmee ha anọghị n'ọrụ taa mgbe Stijn Wuytens nke AZ gbatara penariti site na-ịgbatu Marcus Rashford mana anya Referii erughị ya

Anya ndị mmụọ bụ "Video Assistant Referee" anọkwughị n'ọrụ na asọmpi Yuropa.

Ebe chi United nọ gbutọpụ ha bụ mgbe onye otu ha bụ Lingard merụrụ ahụ nke mere na ha jizi mmadụ iri gbachaa ya bụ bọọlụ.

Nke a bụ ọrụaka ekwensụ anya mmeemmee ka ọ bụ gịnị?

Dani Cabellos onye Arsenal

Ebe foto si, Getty Images

N'aka nke ọzọ mkpọnaala ndị Arsenal dara oke ụda taa ka ha ji ọkpụ anọ asataghị ihe were suchie Standard Liege ntị.

Gabriel Martinelli nyere goolu abụọ ebe Joseph Willock na Daniel Ceballos nyere otu otu.

Ihe Standard Liege nwere ike ị mere onwe ha bụ ịgbata mpempe akwụkwọ uhie ịdọaka na nti ebe ha na akpọ ganịganị ka ha gbata ihe.

Mana Chi ha egbughị ya taa.

Akụkọ ga-amasị gị