Megan Markle: Harry agbaala 'Mail on Sunday' akwụkwọ maka ụtọ ndụ ya

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Megan nwunye 'Duke' nke Sussex amalitela ikpụpụ ụlọọrụ mgbasaozi 'Mail on Sunday' ulọikpe.

Ọ bụ maka etu ha si wepụta akwụkwọ ozi "nke ọ chọghị ka ọha hụ' tiwasara ọha ka ha gụọ.

N'akwụkwọ ozi di ya bụ Harry depụtara ,o kwuru na ha gara n'ihu mee nke a m,aka etu ndị ọjọ si chọọ imetọ ugwu nwunye ya.

Harry kwuru: Nnem nwụnahụrụ m mana ugbua a na m ele nwunye m ka ndị ike meminara nnem chọro imemina ya."

Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ 'Mail on Sunday' kwuru na ụlọọrụ agaghị ehichapụ akụkọ ahụ makana ha dị njikere ịzara ọnụ ha n'ụlọikpe.

Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka okwu a

@dontjealousme kwuru na ọ ghọtaghị ihe mere aha Megan ji ewukarị n'ihu akwụkwọ ụlọ mgbasaozi ọbụla.

@Windfall68 kwuru na ihe ha mere dị mma

Akụkọ ga-amasị gị