Chimamanda Adichie's Americanah: Gịnị ka Naịjirịa na Kenya na-azọ?

Ebe foto si, BBC/Rich Fury
Naịjirịa na Kenya bụkwa otu nna akpọrọ 'Afrịka' mụrụ ha mana ọdịka akwụkwọ "Americanah" nwa ada Igbo bụ Chimamanda Adiche akpariela ndọrọndọrọ n'etiti ha.
Ha abụọ nọ na soshal midịa na-ekwusi ike maka etu Lupita Nyongo bụ onye Kenya sị chọọ ịkpa agwa ka onye Igbo n'ihe nkiri a ga-eji akwụkwọ ahụ wee mepụta.
Chimamanda Adiche dere Amerịcanah n'afọ 2013.
Lupita gotere ohere ijiri akwụkwọ mee ihe nkiri n'afọ 2018.
Mgbe ahụ, Chimamanda kwuru na aka ya agaghị adị n'atụmatụ etu ihe nkiri esi akwụkwọ mepụta.
Mana, ọ sịkwa na ya ga-agba mbọ hụ na enwetere asụsụ Igbo ọfụma na ya bụ ihe nkiri.
Nke pụtara na o nwereike nye aka hụ na Lupita mere nke ọma na ya bụ ihe nkiri.
Kemgbe WarnerMedia's kwuputechara ya, ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia na-ekwesịghị ị nye Nyongo ohere ịkpa agwa ka onye Naịjirịa n'ihe nkiri Americanah makana o nweghị ire ndị mba ahụ.
@Duke Edoho dere na twitter na ọ bụrụ na Nyongo kpa agwa dịka onye Igbo n'ihe nkiri a, ọgaghị atọcha ụtọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Onye ọzọ kwukwara, "anyị nwere ụmụnwaanyị na-eme ihe nkiri ọfụma na Naịjirịa ga-akpali agwa ahụ nkeọma".
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Mana ndị Kenya nọ na twitter kwuchitere nwanne ha ọnụ na-ekwu na onweghị onye Nyongo nọchịrị ụzọ makana ọ bụ ọkaibe n'ihe nkiri.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ụfọdụ chetara ụmụ Naịjirịa na ọ bụ ndagwụrụgwu ọwụwa anyanwu Afrịka kpalitere mmuọ Beyonce ma kwalite ihe nkiri ya akpọrọ 'Lion King'.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Akụkọ ndị ga-amasị gị










