South Africa Xenophobia: 'Ụmụ Nigeria dere du, anyị na-eleba anya na nsogbu a' - Buhari

Ụlọọrụ na-anọchite anya ụmụ Naịjirịa na Saụt Afrịka ekwuputela ihe ha na-eme gbasara mwakpo ọhụrụ e mere ụmụ Naịjirịa na mba ahụ.

N'ime akwụkwọ onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Kabiru Bala degaara ndị ntaakụkọ, o kwuru ihe ole na ole ha na-eme iji kwụsị ọdachi a.

Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ pụtara n'akwụkwọ ozi ahụ.

  • Ndị mwakpo a metụtara gụnyere ọtụtụ ụmụ Naịjirịa
  • Ụlọọrụ anyị dị na Pretoria na Johannesburg na-edekọta aha ụmụ Naịjirịa ihe a metụtara ma na-arịọ ka ndị ha na-edebeghị aha bịa mee mkpesa n'ụlọọrụ ha. O kwuru na nke a ga-eme ka ha nwee ihe ha na gọọmentị mba Saụt Afrịka ga-eji nwee mkparịtaụka
  • Ụlọọrụ nnọchiteanya nke Naịjirịa na mba ahụ nakwa nke nnọchiteanya Saụt Afrịka nọ na Naịjirịa ka dị na mma.
  • Anyị na-arịọ ụmụ Naịjirịa ka obi ha dere duu ka ha ghara imebi mkparịtaụka anyị na gọọmentị Saụt Afrịka na-enwe maka mwakpo ọhụrụ a nakwa etu a ga-esi dozie nsogbu a.
  • Anyị na ndị uweojii Saụt Afrịka na-agba mbọ ịhụ na mwakpo a agaghị emere gaa n'ihu.
  • Anyị ga-agba mbọ ịhụ na njem nleta onyeisiala Buhari ga-aga na Saụt Afrịka n'oge na-adịghị anya, ga-edozi okwu niile gbasara oke mwakpo ụmụ Naịjirịa na mba ahụ.
  • Mwakpo ịkpa oke agbụrụ bụ agwa a katọrọ na mbaụwa niile tụmadị na mba bụkwa Afrịka
  • Iwete ndozi nsogbu nye mwakpo ịkpa oke agbụrụ bụ ihe a na-ejikọ aka eme.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: