You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Anyị agaghị akwụsị ngagharịiwe tutu a kwụsị igbu ụmụ Naijiria na Saut Afrịka'
Ndị otu NANS ekwuola na ha ga-emegide ngagharịiwe ma mechie ụlọọrụ ndị Saut Afrịka nille dị na 36 steeti dị na Naijirịa ma ọ bụrụ na ndị Saut Afrịka akwusighị igbu ndị Naịjirịa nọ n'be ha.
Ụlọọrụ ndị gụnyere MTN Nigeria, Shoprite, Dstv, Gotv, Standard Chartered Bank na ndị ọzọ.
Onye na-ahụ maka mgbasa ozi onyeisi ndị NANS bụ Wande Ajayi kwuru si " Ndị nnọchite mba Saut Afrịka na Nigeria akpọọla anyị oku maka ngagharịiwe anyị mere, mana anyị agaghị aza ha tutu ruo mgbe ndị Saut Afrịka kwụsịrị igbu umunne anyi ndị Naịjirịa nọ n'obodo ha".
N'aka nke ọzọ, onyeisi ndị NANS na Saụt Afrịka bụ Ozoemena Nwamadị na-ariọ ka ndị ogbo ha nọ Naijiria ghara ime ọgbaaghara maọbụ mebie ihe ndị Saụt Afrika dị na Naijiria.
O kwuru na nke nwere ike imetụta ndị Naịjirịa nọ na Saut Afrịka.
Ka akụkọ na-aga, Onowo Ndigbo bi na Saut Afrịka kwadoro oku ndị ụmụakwụkwọ NANS na-akpọ ka akwụsị igbu ndị Naijiria na Saut Afrịka ma na-ekwukwa na ọ ga-adị mma ma ndị otu ọzo na Naịjirịa tinye ọnụ n'okwu ahụ.
Cheta na ọtụtụ ndị mmadu nke gụnyere Peter Obi, Ahmad Lawan, HURIWA na onyeisi ndị NLC bụ Ayuba Wabba, akpọọla oku ka a kwụsi igbu ụmụ Naịjirịa na Saut Afrika.