You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Timi Dakolo: Ana m atụ egwu ndụ m
Aisha Buhari bụ nwunye onyeisiala Naịjirịa dere na Twitter sị ka onyeisi ndị uweojii Naịjirịa tinye anya n'oku ndị otu ya kpọrọ Timi na Busola Dakolo.
Ndị uweojii na onwe ha kọwara ihe mere ha ji wụchie n'ihu ụlọ Timi n'ụbọchị Satọde, Julaị 20, 2019.
Ha dere n'elu Twitter sị na ha gara inye ya na nwunye ya akwụkwọ ozi ha ga-eji bịa za oku a na-akpọ ha n'ụlọorụ ha.
Ha kwuru na ihe mere e ji akpọ ha ya bụ oku abụghị ka anwụchie ha, kama na ọ bụ ka ha bịa kwuru ọnụ ha maka ebubo mwakpo n'ike ha na-ebo ụkọchukwu Biodun Fatoyinbo n'ime nyocha ndị uweojii na-eme.
Nke a na-abịa ka Timi dere n'elu Instagram ya etu ndị ọ na-amaghị bu egbe na ụgbọala si wụchie ụlọ ya ma gbochie ezinaụlọ ya.
O mechara kwuo etu ndị ọkaiwu ya si sị ya kwado maka ụbọchị dị etu a:
Alex Iwobi agọrọla isi onwe ya
N'egwuruegwu nwa afọ Naịjirịa bụ Alex Iwobi ekwuola na ọ nweghị mgbe ya ji kwuo na ya ga-ahapụ Arsenal ma ọ bụrụ na otu egwu bọọlụ ha gote Wilfried Zaha nke Crystal Palace.
Iwobi sị na nke ahụ bụ akaọrụ ndi amụmụ ụgha.
Ndị omekome emekwa ọzọ n'Enugwu steeti
Ka anyị bido n'Enugu steeti ebe ndị omekome wakporo Rev. Fada Ikechukwu Ilo n'Nume dị n'okpuruọchịchị Nkanu East ụbọchị tọzde.
Fada Ikechukwu bụ onye nọ na Annociation Hospital, Emene anata ọgwụgwọ ụgbụa sị na obi dị ya ịnụ na ndị uweojii ekweteghị na ọ bụ ndị Fulani na-achi ehi wakporo ha.
Gọọmentị Zamfara azọpụtala mmadu 15 n'aka ndị ntọrị
Gọọmentị Zamfara steeti azọpụtala mmadu iri na ise bụ ndị ndị ntọrị tọrọ onwa atọ gara aga.
Ndị a zọpụtara gwara BBC na ndị ntọrị a biara n'ụlo ha ma na ugbo ha were tọro ha.
Dịka nkea n'eme ka igwemmadụ bu ozu mee ngagharịiwe n' obi gọmentị ha na Gusau bụ isi obodo ha.
Igwemmadụ a sị Kaura-Namoda tigaara gọọmenti mkpụ, na ike agwụla ha maka ogbugbu ndị omekome na-egbu ndị be ha agbanyeghị akwụkwọ udo ha na ha binyere aka.
Philip Hammond "arụkwaghịm ma Bori Johnson bụrụ onyeisiocheBriten"
Phillip Hammond ekwuola na ya ga-agba arụkwaghị m ọ bụrụ na Boris Johnson mechaa were ọnọdụ dịka onyeisiọchịchị mba Briten.
Iwe Hammond bụ na ọ sị na Johnson enweghị ihe o kwuru ọ ga-eme ma ọ bụrụ na ha na European Union enweghị nkwekọrịta na ọpụpụ Briten chọrọ ịpụ na EU.
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji ebe:
Buhari etiela ndị Sokoto aka n'obi maka ọnwụ mmadụ 37
Onyeisiala Muhammadu Buhari etiela ezinaụlọ ndị ihe metụttara na Sokoto aka n'obi.
Buhari kwara arịrị maka etu ndị omekome si wakpoo okpuruobodo Goronyo dị na Sokoto ma gbuo ihe ruru mmadụ iri atọ.
O kwukwara na ọ ga-agba mbọ hụ na e wepụtara usoro nchekwa ga-arụ ọrụ ma kwụsị oke ogbugbu.
O kwuru nke a ka ọ na-akatọ ogbugbu ndị ahụ.
Peter Obi arịọla maka olileanya
Peter Obi bụ onye zọrọ ọkwa dịka osote onyeisiala n'okpuru pati PDP arịọla ndị Naịjirịa ka ha ghara ịda mba n'inwe olileanya gbasara ihe ga-eme n'ụlọikpe.
O kwuru nke a n'ọgbakọ ndị isi a hụrụ kwaba okpu nke ndị PDP mere n'Ọka dị n'Anambara steeti, ebe ọ nọ kelekwaa ndị otu ya maka mbọ ha gbara oge ntuliaka.
N'ofesi,
Ndị ụlọọrụ ụgbọelu British Airways akagbuola njem niile kwesịrị isi Briten gaa Kairo dị na mba Ijipt n'izu a.
Ha kwuru na ọ bụ maka ihe gbasara nchekwa ka ha ji kagbuo ya, mana ha ekwughi ihe ọ bụ kpomkwem.
N'egwuregwu,
Ndị CAF kwuru na goolu narị na abụọ e nyere n'asọmpi Iko Mba Afrịka nke afọ a bụ nke a kachasị nye n'ime otu asọmpi kemgbe e hibere asọmpi a.