You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Volkswagen Beetle: A kwụsịla nrụpụta mbe korota kpam kpam
Ọbịara ije nwe ụna bụ egwu eji kelee ụgbọala mbe korota n'ụlọọrụ Volkswagen dị na Mexico ụnyaahụ.
Volkswagen akwụsịla ịrụpụta ya bụ ụgbọala kpam kpam n'ihe karịrị afọ iri asato kemgbe arụpụtara ya mbu.
Ụgbọala a gazuru ụwa dum ma bụrụ ụgbọala ọtụtụ mmadụ iji sonyere na ndị na-agba ụgbọala.
Kemgbe arụru ya, arụgharịrị ụgbọala a ugboro atọ.
Nkwụsị imepụta ya bu maka ụdịrị ụgbọala adịghị amasịzi ndị mmadụ dịka ọ bụzị nnekwu ụgbọala nke a kpọrọ "SUV" na Bekee.
Eji egwu, mmemme na aṅụrị were dulaa ya bụ ụgbọala sị ya "Daalụ".
Ndị mmadụ jikwa #ByebyeBeetle bunye ya ụkpa ekele n'elu soshal midia.
Ọchịagha mba Jamini akpọrọ Adolf Hitler bụ onye mbụ kwọrọ ya bụ ụgbọala n'afọ 1938.
Lee nwaafọ Naịjirịa na-arụpụta ụgbọala: