Volkswagen Beetle: A kwụsịla nrụpụta mbe korota kpam kpam

Úgbóala Korota
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ọbịara ije nwe ụna bụ egwu eji kelee ụgbọala mbe korota n'ụlọọrụ Volkswagen dị na Mexico ụnyaahụ.

Volkswagen akwụsịla ịrụpụta ya bụ ụgbọala kpam kpam n'ihe karịrị afọ iri asato kemgbe arụpụtara ya mbu.

Ụgbọala a gazuru ụwa dum ma bụrụ ụgbọala ọtụtụ mmadụ iji sonyere na ndị na-agba ụgbọala.

Kemgbe arụru ya, arụgharịrị ụgbọala a ugboro atọ.

Ụgbọala Mbe Korota ikpeazụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkwụsị imepụta ya bu maka ụdịrị ụgbọala adịghị amasịzi ndị mmadụ dịka ọ bụzị nnekwu ụgbọala nke a kpọrọ "SUV" na Bekee.

Eji egwu, mmemme na aṅụrị were dulaa ya bụ ụgbọala sị ya "Daalụ".

Ndị mmadụ jikwa #ByebyeBeetle bunye ya ụkpa ekele n'elu soshal midia.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ọchịagha mba Jamini akpọrọ Adolf Hitler bụ onye mbụ kwọrọ ya bụ ụgbọala n'afọ 1938.

Eji egwu sí Mbe korota ga nke óma

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Eji egwu si mbe korota ga nke ọma

Lee nwaafọ Naịjirịa na-arụpụta ụgbọala:

Aha onyonyo, Lee Alex Nwa-Ephraim Akwaiwu nwa afọ Igbo na-arụ ụgbọala