Ukraine and U20 world cup: South Korea eburula ihe na-esi n'iko mbaụwa U20

Ebe foto si, Getty Images
Ndị egwu bọọlụ mba Ukraine ewerela ọkpụ goolụ atọ asatara otu merie Saụt Korea were maburu iko mbaụwa ndị erubeghị afọ iri abụọ agbara na mba Poland taa bụ Satọde.
Mmeri a bịara ka ndị Saụt Korea nwetechara penariti n'ụzọ ụtụtụ ya bụ egwuregwu na nkeji ise bụ nke Lee Kang-in tinyere ha na goolu.
Mana Ukraine gwara Saụt Korea na ha apụtaghị egwu ọnwa mgbe Vladyslav Supriaga sara ya bụ goolu na nkeji iri atọ na anọ.
Vladyslav Supriaga kwuru n'ezie na-ejighị ụtụtụ ama njọ ahịa na nkeji iri ise na atọ bụ mgbe o tinyere goolu nke abụọ ya n'ọnụ mpiọ ndị Saụt Korea.
Ndị Korea kpọkwara ganịganị ọtụtụ mgbe mana Ukraine gwara ha na ogologo abụghị na nwa m etoola mgbe ha mezuru ya ọkpụ atọ site n'aka Giorgi Tsitaishvili na nkeji iri asatọ na itoolu.

Ebe foto si, European Photopress Agency
Ụwa gbara Saụt Korea gharị mgbe opi ike daara na ngwụcha ya bụ egwuruegwu.
Nke a bụ mbụ Ukraine na-emetu ya bụ iko mbaụwa aka ka England buchere ya afọ abụọ gara aga.











