Muhammadu Buhari: Ndị kpọrọ m 'Baba-go-slow slow' bịa hụrụ m na-agba nke abụọ

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Buhari ekwuola na Bukola Saraki na Yakubu Dogara megidere onwe ha site na etu ha si jide bọjeti ruo ọnwa asaa tupu ha ewepụta ya.
Buahri kwuru nke mgbe ọ na-aza onye ntaakụkọ NTA ajụjụ ọnụ gbasara etu ọ ga-esi me ihe dị iche n agba nke abụọ ọchịchị ya dịka onyeisiala Naịjiịa.
O jikwa ohere ahụ kwuo na ọ ga-agba mbọ hụ na ndị uweojii na ndị ọkaiwu rụrụ ọrụ ha ọfụma,
Ọ rịọrịọ ndị Naịjirịa ka ha gba ndị omekome nọ n'agbataobi ha n'anwụ ka obodo naịjirịa nweike ịdọbata ndị oji ego achụ ego si mba ofesi.
Ihe ndị ọzọ kwuru na mkparịtaụka a:
- Ndị na-akpọm 'Baba nwayo nwayo" ga-ama ma m na-akpụ akpụ ka m na-efe efe.
- O nweghị okpuruọchịchị ma agatụbeghị
- Anyị emeriela Boko Haram
- M ga-arịọ ndị uweojii na ndị ọkaiwu ka ha mesie ndị na-eme mpụ ike
- Obi mgbawa m bụ na agha a na-ebuso ndị na-eme mpụ na-egbu oge
- E ji m usoro ama ama wee họpụta ndị isi nchekwa m
- Ndị uweojii adaala n'ọrụ ha.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu soshal midia
@AkinbolaRoqeeb toro onyeisiala etu o si wepụta aka ọhụrụ maka ndị uweojii na ndị ọkaiwu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post







