Game of Thrones Season 8 Episode 6 : Ihe nkiri a agbagwọjụrụ gị anya?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ka izu asatọ na agba iri asaa na atọ gafechara, ihe nkiri "Game of Thrones" kopụrụ mbaụwa abịala na ngwụcha.

Mana ngwụcha ihe nkiri a atọghị ụfọdụ ọchị maọlị dịka ha si depụta n'elu soshal midia.

Ndị mmadụ na-tụ anya na a ga-enwe onye ga-anọdụ n'elu oche eze igwe ahụ makana ọtụtụ ndị na-ekiri ya bụ ihe nkri hụrụ ọgụ na mgba merenụ dịka a na-azọ onye ga-echi eze.

Ihe mkpesa edepụtara n'elu soshal midia maka ịgwa onye mepụtara ihe nkiri a ka o megharịa agba ikpeazụ agafeela otu ndew n'ụma.

Gịnị mere ha ji si na ihe nkiri a agwụchaghị etu ha si che?

@kemiadetiba bụ onye na-eme ihe nkiri ama ama kacha buru ihe a n'isi dịka o depụtara ka ihe nkiri a si kwesị ịgwụcha.

@TiquetWan kwuru na ọ ka dị ya ka ọ bụ na nrọ etu ihe nkiri a si gwụcha.

Mana ndị ọzọ na-ekwu ihe dị iche

Ka anyị na-ele anya, mara ma ndị na-emepụta ihe nkiri a aga-emegharị ya dịka ndị nso nso ha si ekwu.

Akụkọ ndị ga-masị gị: