Anglican Church of Nigeria: Ihe anyị dere maka ọchụchụ ndị ụkọchukwu bụ eziokwu

Akụkọ ọzọ pụtara na ndị ụka Anglican nke Isiala Ngwa Diocese dị n'Abia Steeti achụọla ndị ụkọchukwu ha mmadụ anọ.

A sị ha dara iwu site n'inwe mmekọrịta nwoke idina nwoke bụ 'Homosexual' n'ụzọ dị iche iche.

Ozi si n'akwụkwọ ozi Bishọp na-achịkọta Isiala Ngwa bụ Rt. Rev Temple Nwaogu zigara ndị isi ụka Anglican na Naịjirịa kwuru na ha enyochala ma chọpụta na ha mere nke a n'eziokwu.

Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ Bishọp na-achịkọta Isiala Ngwa Diocese bụ Rt Rev. Temple Nwaogu, o kwuru na nke a bụ eziokwu na-achụrụ ndị ụkọchukwu ha mmadụ anọ.

O kwuru na ha mere nyocha ma chọpụta na ndị ụkọchukwu a nwere mmekọ nwoke idina nwoke nke mere e ji chụọ ha.

Rev Nwaogu sị na ụka Anglican nwere usoro ha ji eme ihe bụ nke o merela site n'izi ndị isi ụka Anglican ozi banyere nke a.

Ọ gara n'ihu kwuo na ha achọghị ka eburu akụkọ a na-efegharị n'ụzọ na-adịghị mma, na ha emela ihe ha kwesiri ime.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: