Ihe nkiri Black Panther enyela ndi mmadụ aṅụrị

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ihe nkiri Black Panther nke ụlọọrụ Marvel mepụtara n'ewuewu ugbua.

Ihe nkiri a nọzị ọnọdụ ihe nkiri kachasị enweta ego na mmepe ya na sịnịma dị icheiche n'ụwa niile.

Black Panther bụ akụkọ maka otu mba Afịrịka (n'abụghị obodo di n'ihe) a na-akpọ Wakanda na eze ha a na-akpọ Black Panther.

N'ihi na ọ bụ mbụ a na-eme udịrị ihe nkiri a gbasara Afịrịka na ndị isiojii, ụmụ Afịrịka na ụwa niile na-enwe aṅụrị maka ya.

Ya mere ụfọdụ ji n'eyi uwe ejiri mara ndị Afịrịka na-aga ikiri ya bụ ihe nkiri na sịnịma ndị dị na mba Saụt Afịrịka.

N'Amerịka

Ma na Naịjirịa

Ka ndị mmadụ na-enwe aṅụrị, ihe nkiri a nọkwa n'akpata ego etu pụrụiche.

Ugbua, Black Panther eritela ijeri naira 79 n'ihe eji agụ etu esi ere ihe nkiri a na-akpọ box office n'asụsụ bekee.