Liverpool vs Barcelona: Ndị ụka taa dịka otu Barcelona - Fr. Mbaka

Father Mbaka agwala ndị ụka ha ghara ịnọzị chakoo dịka Barca ganye na Liverpool edula ha mmuọ.

O kwuru na asọmpi bọọlụ ahụ kwesịrị ikuzịrị ndị otu kristi ka ha wepu mpako na ndụ ha.

Mbaka kwuru na nke a gosiri ihe akwụkwọ nsọ kwuru na nganga buru ụzọ, ọdịda esoro ya n'azụ,

Nke a bịara n'ekpere ụbọchị Wenezde ọbụla ya bụ "I no dey again" na obi Adoration Umuchigbo, Iji Nike Enugwu.

Ọ dọrọ ndị ụka katọliki aka n'nti ka ha ghara ịdị na akatọ ya kama ka ha mara na oge eruola mgbe ụka ga agbanwe.

Ọ gwara ha nabata na ọtụtụ na agbagazị ụka pentecostal maka amụma na ihụ ọhụ.

Mbaka kwuru na-agbanyeghị mmekpa ahụ ọbụla na ya ga akachị ntị na ebu amụma, ekpe ekpere, agwọ ọrị na ahụkwa ọhụ.

Na ọ bụ na-aha Chukwu nna, nwa na mụọsọ onye nyere ya onyinye ahụ ka o ji aga.

Akụkọ ga-amasị gị