You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'World Wide Web' agbaala afọ iri atọ
Mbido "world wide web" a ma dịka www, nọ na-ata arụ maka ihe ndị dịka ihe bekee kpọrọ "dial-up tone", websaịt ndị kpụkọrọ akpụkọ, CD e ji amụta ihe ndị a na-enye n'efu, nakwa ihe ndị ọzọ ga
na-atọ ọchị ugbua.
Afọ iri atọ taa, Tim Berners-Lee tinyere akwụkwọ mụpụtara "world wide web".
Iji mee ncheta ọmụmụ "www" a, ndị malitere iji ya mee ihe oge ọ malitere, ndị ụlọọrụ teknụzụ, nakwa ndị lara ezumiike nka site na ndọrọndọrọ ọchịchị, banyere Twitter ebe ha ji #Web30 na-echeta ihe mbụ ha mere n'elu "world wide web".
Lee ụfọdụ ndị tinyere ọnụ n'okwu a:
Al Gore bụbu osote onyeisiala mba Amerịka, so n'ime ndị kwuru okwu.
N'afọ 1994, Bill Clinton bụbu onyeisiala mba Amerịka na Carl Bildt bụ praịm minista mba Swidin mgbe ahụ, bụ ndị isiala mba mbụ bu ụzọ zie ozi n'elu www.
Mgbe o ruru afọ 2000 bụ afọ ụlọọrụ nyocha Pew dị na mba Amerịka nyochara mmadụ ole na-eji ịntanetị eme ihe, ihe karịrị ọkara mbaụwa amalitela iji ịntanetị.
Ọ ga-ara ahụ ichefu ụdịrị mkpọtụ "dial-up" ahụ na-eme mgbe gboo ahụ.
Ndị Google tinyere ya n'ihu ọrụ ha iji mee emume ncheta afọ iri atọ ya.
Gịnị dị iche n'etiti "world wide web" na ịntanetị?
Charles Babbage malitere ihe gbasara kọmputa n'ebe mbido senchuri 19, mana a rụghị kọmputa ọbụla ruo afọ 1939 mgbe a rụrụ nke mbụ, ka e hibechara ụlọọrụ kọmputa nke mbụ.
N'afọ 1960 na ụma, ụmụakwụkwọ abụọ malitere teknụzụ na-ebufe ozi site n'otu kọmputa banye ọzọ. Nke a bụ ihe a kpọrọ "apranet", mgbe mbụ ịntanetị na-apụta.
E mepụtara apranet a ka ndị agha mba Amerịka were ya na-akpa nkata oge a na-alụ agha "cold war". E mere nke a ruo mgbe afọ iri abụọ ọzọ ruru, oge Tim Berners-Lee wepụtara ihe na-ejikọ kọmputa ole na ole.
Etu a ka e si mụọ braụza ịntanetị na www.
Ugbua, a na-eche ịntanetị dịka Google Chrome, Mozilla Firefox na Internet Explorer. Berners-Lee ka anyị ga-ekele maka ya, makana ọ bụ n'afọ 1989 ka a kpọpụtara "braụza" n'ime ozi atụmatụ o wepụtara.
Ebe mbụ e kewapụtara n'ịntanetị bụ http://info.cern.ch/ ọ ka nọkwa ruo ugbua.
Ihe gbasara #Web30
Early websites
Ụlọọrụ ndị dịka Amazon na Craigslist gara na soshal midia igosipụta websaịt mbụ ha.
Akụkọ ga-amasị gị: