Rochas Okorocha: O soghi na ndị natara 'certificate of return'

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Inec mezuru nkwa ya taa site n'igbajo ịnye Rochas Okorocha asambodo mmeri ya makana ha nwetara akụkọ na wakporo onye ụlọọrụ Inec.

Mana Okoroocha kwuru na Inec enweghị ikike ime nke a.

Onụ na-ekwuchitere ya n'ihe gbasara mgbaozi soshal midia bụ Ebere Nzewuji kwuru na ha mabeghị ihe ha ga-eme ugbua gbasara ya bụ mkpebi.

Mgbe a jụrụ ya ma Okorocha a ga-eje ụlọikpe ? O kwuru na ọ mabeghị.

Onye ọ bụla meriri na ntuliaka na-enweteghị asambodo mmeri nke Inec na-enye agaghị aba n'oche eze ya dịka ọkaiwu Goddy Uwazurike si kọwara BBC.

Lekwa ihe nkiri ya ebe a.

Na nkọwa ya, asambodo mmeri ga-enye onye ahụ ikike ịbanye ebe o nwetere mmeri ịchị.

Uwazuruike kwuru na onye ọbụla merịrị na ntụliaka na-enweteghị asambodo mmeri ya nwereike ịkpọpụ Inec ụlọikpe.

Uche Ekwuinife natara ikike mmeri dịka sinetọ ga-anọchite anya ndị Anambara sentralụ.

Ike Ekweremadu nwetere asambodo mmeri dịka onye ga-anọchite anya ndị si ọdịda anyanwụ Enugu n'ụlọomeiwu sineti.

Kamgbe emechara ntuliaka nke ọkwa sineti, Inec enyela onyeisiala Buhari na osote ya asambodo mmeri ma nyekwa ndị otu ụlọomeiwu ukwu nke ha.

Ndị nweterela asambodo mmeri ha

Akara twitter @BMB1_Official na-egosi ndị sinetọ meriri n'ugwu.

Inec ga-enye ndị otu ụlọomeiwu nta n'elekere abụọ nke ehihie taa bụ Maachi iri na abụọ.

Akụkọ ga-amasị gị ịkọ