Imo Election Results: Ihe asaa gbara ọkpụrụkpụ Uche Nwosu kwuru

Igbo juru n'Owere mgbe BBC Igbo mere nrụrịta ụka nke ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo steetị mana ọ bụ ihe tụrụ ndị Imo n'anya na naani otu onye n'ime mmadụ anọ kwesre BBC Igbo nkwa na ha ga-abịa nrụrịta ụka ahụ bụ ihe bịara ya.

Ndị a tere ndị Imo ụnyị n'ihu bụ Emeka ihedioha PDP, Hope Uzodimma nke APC na Ifeanyi Ararume nke APGA.

Onyeisi BBC Igbo bụ Adline Okere sị na ọ bụ sọọsọ Ararume bụ onye gwara ya na ya nwereike ghara abịa maka na ya na-amalite achụm nta vootu ya.

Ya bụ emume bidoro ka o ji ọkara gacha elekere abụọ n'ehihe.

Na nrụrịtaụka ahu sọọsọ ya bịara, Uche Nwosu kwere nkwa na ya ga-akwụ pụkụ naira iri atọ dịka ụgwụ ọnwa opekatampe ma ọ bụrụ na gọọmenti etiti hibe ya.

Nwosu gakwara n'ihu kwuo na pati ya enweghi onye na-azọ onyeisiala ka o tinyere ọnụ n'okwu banyere nkwado o na-enye Onyeisiala Muhammau Buhari.

Ihe ọzọ o kwuru bụ; "O nweghị ihe ọ bụla nọ na 'manifesto' m agaghị eme."

Okwu asaa gbara ọkpụrụkpụ Uche Nwosu kwuru:

Nwosu kwupụtara ihe ọ ga-emere ndị steeti Imo ma o were ọkwa ọchịchị na ntụliaka a ga-eme n'ọnwa Maachị afọ 2019.

Ngwa, lee ihe ndị ọ rụtụrụaka na nkeji na nkeji:

  • A ga m eweta agụmakwụkwọ bụ ịgba site na mgbakọ aka ndị ụka
  • A ga m eme ka ahụike bụrụ n'efu maka ụmụaka, ụmunwaanyị dị ime nakwa ndị okenye
  • A ga m eme ka ndị ntorobịa bata n'ọrụubi
  • A maara m nke ekwe na-akụ n'ihe gbasara okwu ọchịchị
  • A ga m eme kai he ndị e ji ebi ndụ baara ndị Imo ụba
  • A ga m akwụ ụgwọ ọnwa ọpekatampe puku iri naịra atọ ma gọọmenti etiti kwuputa ya
  • A ga m eleba anya n'ihe gbasara ụgwọ ezumike nka

Akụkọ ga-amasị gị: