Nigeria Election 2019: Ndị na-azọ ntuliaka na osote ha

Lee mmadụ isii na-azọ ọkwa onyeisiala ndị mmadụ kacha anụ aha ha na ndị osote ha:

Ka otu na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ "Independent National Electoral Commission (INEC)" bipụtara akwụkwọ gosiri na ihe karịrị mmadụ iri asaa na-azọ ọkwa onyeisiala na 2019, BBC Igbo chọrọ igosi gị ndị nke aha ha kacha ada ụda.

N'ime mmadụ isii a na ndị osote ha, e nwere ụmụnwaanyị atọ n'ime ha; otu na-azọ onyeisiala ebe ndị ọzọ na-azọ osote.

1) Muhammadu Buhari na Yemi Osinbajo

Onye bụ Muhammadu Buhari?

  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Disemba afọ 1942
  • Ọ chịala Naịjirịa ugboro abụọ; dịka onye agha nakwa onye nkịtị
  • Ọ zọrọ ọkwa onyeisiala ugboro atọ (2003, 2007 na 2011) tupu ọ zọta ya n'afọ 2015
  • N'otu aka a ọ bụ onyeisiala, ọ bụkwa onye mịnịsta na-ahụ maka mmanụ amịpụtara n'ala

Onye bụ Yemi Osinbajo?

  • A mụrụ ya n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Maachị afọ 1957
  • Ọ bụ ụkọchukwu n'ụka Redeemed Christian Church of God(RCCG)
  • Ọ zọtara ọkwa osote onyeisiala Buhari n'afọ 2015
  • Ọ bụkwa ọkaiwu ọnụ na-eru n'okwu

2) Atiku Abubakar na Peter Obi

Onye bụ Atiku Abubakar?

  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Nọvemba n'afọ 1946
  • Ọ bụ osote onyeisiala site n'afọ 1999 ruo 2007
  • Ọ zọọla ọkwa onyeisiala dịka onye bu ọkọrọtọ pati ya ugboro abụọ; n'afọ 2007 n'okpuru AC nakwa 2018 n'okpuru PDP
  • Ọ bụ onye achụmnta ego nwere ọtụtụ azụmahịa dị iche iche

Onye bụ Peter Obi?

  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Julaị n'afọ 1961
  • Ọ zọtara gọvanọ Anambara steeti n'okpuru pati APGA n'afọ 2003 mana ọ rigoghị n'oche ruo Maachị 2006 mgbe o meriri n'ụlọikpe, mana e mechara chutuo ya n'ọnwa Nọvemba afọ ahụ.
  • O mechara lọghachita n'oche ya na Febrụwarị 2007, ma pụọ na Mee oge Andy Uba meriri ya, mana ụlọ ikpe kwuru ka a hapụ ya nọzuo afọ anọ ya.
  • O rituru n'oche dịka gọvanọ Anambara n'afọ 2014 ka ọ chizuru ugboro abụọ
  • Ọ bụ onye ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba

3) Oby Ezekwesili na AbdulGaniyu Galadima

Onye bụ Oby Ezekwesili?

  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Epreelụ 1963
  • Ọ bụ mịnịsta na-ahụ maka ihe e gwuputara n'ala site na 2005 ruo 2006 nakwa nke agụmakwụkwọ site na 2006 ruo 2007
  • O so hibe otu "Bring Back Our Girls (BBOG)" na-ahụ maka ụmụaka Chibok a tọọrọ kemgbe afọ 2014
  • O merie, ọ ga-abụ nwaanyị mbụ ga-abụ onyeisiala na Naịjirịa

Onye bụ Ganiyu Galadima?

  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri na otu ọnwa Jun nke afọ 1964
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Kwara steeti ebe o mechara bụrụ otu onye n'ime otu ndị na-achị n'ụlọ akwụkwọ ahụ
  • Ọ bụbu onye zọrọ oche onyeisiala n'okpuru pati ACPN n'afọ 2015
  • Ọ bụ onye ojiegoachụego

4) Kingsley Moghalu na Umma Getso

Onye bụ Kingsley Moghalu?

  • A mụrụ ya n'ụbọchị asaa nke ọnwa Mee nke afo 1963
  • Nke a bụ mbụ ọ na-azọ ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa
  • Ọ gụru akwụkwọ ma nata asambodo dịka ọkaiwu na mahadum
  • Ọ bụkwa onye ọkachamara n'ihe gbasara ịchekwa akụnaụba.
  • Ọ rụrụ dịka directọn n'ụlọakụ etiti nke a kpọrọ Central Bank of Nigeria(CBN) na bekee.

Onye bụ Umma Getso?

  • A mụrụ ya n'afọ 1981
  • Ọ bụ osote onyeisioche otu pati ha bụ YPP
  • Ọ bụ onye ojiegoachụ ego, nakwa onye na-agba mbọ n'ihe gbasara ikike ruuru ụmụnwaanyị

5) Omoyele Sowore na Rabiu Ahmed Rufai

Onye bụ Omoyele Sowore?

  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Febrụwarị 1971
  • Ọ bụ onye na-ebu ihe gbasara ikike dịrị onye n'isi. Ọ malitere ya oge ọ ka nọ na mahadum
  • O hibere ụlọọrụ ntaakụkọ 'Sahara Reporters'
  • O hibere otu pati AAC n'ọnwa Ọgọstụ nke 2018

Onye bụ Rabiu Ahmed Rufai?

  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Julaị 1976
  • Ọ bụ dibia Bekee maọbụ dọkịnta bụ ọkachamara n'ihe gbasara ahụ ike
  • Ọ kuziburu nkuzi na mahadum Bayero dị na Kano

6) Fela Durotoye na Khadijah Abdullahi-Iya

Onye bụ Fela Durotoye?

  • A mụrụ ya n'ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Mee n'afọ 1971
  • Ọ gara mahadum Obafemi Awolowo dị n'obodo Ile-Ife
  • Ọ bụ onye na-akụziri ndị mmadụ etu e si eji ego achụ ego, ma bụrụkwa onye na-eji okwu akpalite mmụọ ndị mmadụ
  • Ọ na-azọ ọkwa Onyeisiala n'okpuru pati Alliance for New Nigeria (ANN)

Onye bụ Khadijah Abdullahi-Iya?

  • Ọ bụ onye hibere otu na-ahụ maka nlekọta ụmụnwaanyị bụ "Women Community of Africa (WCA)" nakwa "Rags to Riches (R2R)"
  • Ọ bụkwa onye ọkaiwu

Kedụ onye ị ga-atụnyere?