You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Imo APC Primaries: A kpọpụtala Uche Nwosu dịka onye ga-azọ ọkwa gọvanọ Imo
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
A kpopụla ọgọ Rọchas Okorocha bụ Uche Nwosu dịka onye ga-azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti n'aha APC n'afọ 2019.
Onyeisioche kọmịtị na-ahụ maka ntuliaka imeụlọ bụ Bigadia-Generalụ Ibrahim Agbabiaka bụ onye kwupụtara nke a kwuru Nwosu nwetara vootu kachasị na ntuliaka o jiri merịa mmadụ asatọ ndị ọzọ zọrọ ọkwa ahụ.
Na ịnabata mkpọpụta ahụ, Nwosu kelere APC Imo were kwuo na ihe ọzọ fọdụrụ bụ inweta mmeri na ntuliaka izugbe ga-eme na 2019.