Lai Mohammed: Atiku ga-aza azịza maka ebubo na aka ya dị n' ọdịda ụlọakụ PHB

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ dị mkpa taa

Mịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi na Naijiria bụ Lai Mohammed ekwuola na Atiku Abubakar bata mba Amerika ebe ọ gara njem, na o nwere ajụjụ ọ ga-asa gọọmenti maka ebubo na aka ya dị na ọdịda ụlọakụ PHB.

Mohammed kwuru na gọọmenti etiti na-enyocha 'akwụkwọ gosiri na o nwetara otu nari nde naira na iri ise na isii (N156 million)."

N'okwu ala Amerịka Atiku gara, o kwuru na o nwere ohere ịnọ ebe ahụ oge ole masịrị ya mana ọ lọta, ọ bịa zara ọnụ ya.

Ụfọdụ ndị mmadụ etinyela ọnụ n'okwu ahụ Laị Mohammed kwuru.

Onye e ji okwu ya agba izu n'otu pati PDP nke steeti Imo bụ Maazi Ndụbụisi Williams, tiri obewu na nkata a gọọmenti etiti na-akpa pụtara "ịchụgharị onye na-enweghị ihe o mere."

Ọ gakwara n'ihu ma dụọ gọọmenti etiti ọdụ ka ha wepụ aka enwe n'ofe, ma kagbuo atụmatụ ahụ nke o kwuru nwere ike iwetara ntụliaka ọnwa Febụwarị ihe mkpọbi ụkwụ.

Ụmụ Naijiria nọ n'igwe okwu Twitter na-ekwukwa nke ha banyere ihe Lai Mohammed kwuru.

@john_danfulani kwuru na ọ masị gọọmenti etiti ha tinye Atiku na mkpọrọ na o nweghị ihe ga-eme ka ha ghara ịtụnyere ya vootu.

@KeehNee kwuru na okwu Lai Mohammed na-egosi na gọọmenti nọ n'ọchịchị chọrọ ijidesi ọkwa ike n'ụzọ abụla ụzọ.

Ụlọikpe atọhapụla Sinetọ Dino Melaye onye ndị uweojii ji kemgbe izuụka abụọ o jiri nyefe onwe n'ebubo na ọ chọrọ igbu mmadụ.

BBC Igbo hiwere nrụrịtaụka ọkwa gọvanọ n'Imo steeti na Fraide

N'akụkọ metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị, BBC Igbo ga-eme emume nrụrịta ụka nke ndi na-azọ ọkwa govanọ n'Imo steeti taa.

Ndị adọrịta ụka taa bụ Hope Uzodinma, Uche Nwosu, Ifeanyi Ararume na Emeka Ihedioha. Ọ ga-amalite n'elekere abuọ nke ehihe.

Ọzọ,

Atiku Abubakar bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'okpuru otu PDP nọ n'Amerịka ugbua.

Njem Atiku a bụ mbụ ọ ga-aga Amerịka kemgbe ihe ruru afọ iri n'abụọ. Ọ sị na ọ ga-eji ohere a leta ndị ọrụ gọọmentị Amerika nakwa ụmụ Naijiria bi mba ahụ

Gụọ ya n'uju ebe a

Na ofesi,

Ọgbakọ mba Afrịka bụ African Union arịọla ka mba Kongo DRC dọtịa aka mgbe ha ga-akpọpụta aha onye meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala ha mere.

Ọnụogugu nke ngalaba na-ahazị ntuliaka na mba ahụ weputara na-egosi na Felix Tshisekedi meriri mana onye ọzọ aha bụ Martin Fayulu na-esi ọnwụ na ọ bụ ya meriri.

N'egwuregwu,

Ndị Super Falcons nke NaỊjirịa natara ọkpụ goolu atọ na-asataghị otu n'aka otu egwuregwu bọọlụ umunwaanyị nke China n'asọmpị enyi n enyi ha gbara n'ụbọchị tọọsde na Romania.

Falcons ga-ezute Romania na-agba a ga-eji mara onye ga-abụ onye nke atọ na asọmpị a.

Akụkọ BBC na Nkeji

Ihe onyonyo nke taa