Nigeria 2019 elections: Njirimara ndị na-azọ oche Onyeisiala – Muhammadu Buhari

Onyeisiala Muhammadu Buhari na-achụ nta vootu ugbua iji bụrụ onyeisiala Naịjirịa nke ugboro atọ.

O bu ụzọ bata ọchịchị n'ọnwa Disemba 1983 (1984) ka ndịagha Naijirịa nara ọchịchi n'ike, mana ụfọdụ ndị agbatobi ya chuturu Buhari n'ike n'afọ 1985.

Buhari mechara bụrụ onyeisiala site na ndọrọndọrọ ọchịchi onye kwuo uche ya na'afọ 2015, ka ọgbara mbọ ịnweta ya bụ oche ugboro atọ n'efu.

Dịka mgbe ọ na-achị dịka onyeagha, Buhari enweghị ezigbote aha banyere ikike diri onye.

Agbanyeghi na-anọ n'ọchịchi onye kwuo uche ya, ọtụtụ mmadụ nọ na mkpọrọ maka Buhari ekweghị ịtụhapụ ha dịka ụlọikpe sị ka eme.

*Nwoke a dị afọ 76 ṅụrụ iyi ọrụ n'afọ 2015, ma kwe nkwa na ya ga-ebuso agha megide mpụ na nrụrụaka na ọgbaghara, nakwa kwalite akụnaụba Naịjirịa.

Afọ anọ na-abịa na ngwụcha mana ọtụtụ ndị mmadụ ekweghị na ihe o mere pụtara ihe anya na-ahụ.

Okwere nkwa na ya ga emeri Boko Haram na-agha Naịjirịa na-ebuso ndị a chọro ikewapụta mba ofufe alakuba na ọwụwa anyanwụ ugwu Naịjirịa, mana na nso a, ndị a na-akpazị ike na-enye ebumnobi Buhari inọdụ n'oche onyisiala nsogbu site n'etu ha si awakpo mpaghara ahu.

Ndị ọnụ ha na-eru n'okwu kwenyere na Buhari ga-ezute ezigote ọgụ n'aka pati na-anọghị n'ọchịchi aha ha na-ada ụda karịa - onye bu ọkọlọtọ PDP bụ Atiku Abubakar bụkwa onye ofufe alakuba ma sikwa ugwu Naịjirịa dịka Buhari.

Buhari bụ onye buu ọkọlọtọ All Progressives Congress (APC) nwere aha dịka onye aka ya kwụ ọtọ n'ime dị ndọrọndọro na Naịjirịa, agbanyeghị na ọtụtụ mmadụ na-ahụ achumta vootu ya ka ihe na-egosị mkwafu akụnaụba.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: