Imo state results: Ọ ga-akpọtu n'Imo steeti echi

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Nrụrịtaụka nke BBC haziri maka ndị na-azọ ọkwa gọvanọ jisike aga n'ihu ugbua.

Ọ ga-akpọtụ taa na Legọs ebe BBC Yoruba na-eme nke ha nakwa na Akwa Ibom ebe BBC Pidgin ga-eme nke ha.

N'ụbọchị Fraide nke ọnwa Jenụwarị ka nke mbụ ga-akpọtụ n'ala Igbo ka mmadụ anọ na-azọ oche gọvanọ n'Imo steeti.

Ndi ga-apụta n'Imo bụ Hope Uzodimma, Uche Nwosu, Ifeanyi Ararume na Emeka Ihedioha.

Ihe ndị ndọrọndọrọ ọchịchị a ga-akpa maka ya bụ mwulite ọchịchị bara uru.

Ozi a nke BBC Pidgin ziputere n'akara Twitter ha gosiri nrụrịtaụka niile ga-eme n'ala Naịjirịa.

BBC Igbo ga-emekwa nrụrịtaụka ọzọ n'izuụka n'abịa n'Abịa steeti.