2019 Election: Lee ndị ntorobịa chọrọ ịzọ ọchịchị n'Imo steeti

Dịka ntuliaka a ga-eme iji họpụta ndị ga-anọchi ndị mmadụ bido na 2019 ruo 2023 na-abịa nso nso, BBC Igbo chọrọ ịgba ndị chọrọ ịnọchite ndị Imo steeti n'anwụ.

N'ime ọnwa ole na ole gara aga, Onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ kwuru na ndị ntorobịa nwere ike ịzọ ọkwa ọchịchị.

Nke a mere ka obi kaa ndị ntorobịa, mee ka ha bido ịpụta n'igwe kwupụta ebumnuche ha gbasara ịzọ ọkwa ọchịchị gọọmentị.

BBC Igbo jụrụ ma e nwere ndị dị afọ 18-40 chọrọ isonye ọchịchị n'afọ 2019, lee ndị nke si Imo steeti.

Ụlọomeiwu ukwu:

Precious Uwadikaechere Nwadike dị afọ 38, bụ onye ntaakụkọ nwekwara ụlọọrụ akwụkwọ akụkọ.

Ọ bụ onye Ọlụ chọrọ ịnọchite anya 'Imo West' n'ụlọomeiwu ukwu.

Ụlọomeiwu nta

1. Chinedu Nnawuihe Onyegbula dị afọ 36, bụ Injina.

Ọ bụ onye Nkwerre chọrọ ịzọ oche n'ụlọomeiwu nke nta.

2. Obinna Ebirim dị afọ 32, bụ dọkịta

Ọ chọrọ ịnọchite anya Mbaitoli/Ikeduru n'ụlọomeiwu nta

Gọvanọ

Dr Anthony Iroegbu Njoku dị afọ 37, bụ Injinia.

Ọ bụ onye Ogbe, Ahiazu Mbaise, chọrọ ịnọchi Rochas Okorocha n'oche gọvanọ.

Ụlọomeiwu nke steeti

1. Prince Ngozi Roosevelt Mbamara dị afọ 32, bụ onye ọkaiwu.

Ọ bụ onye Amato-Amaraku chọrọ ịnọchite anya ndị Isiala Mbano n'ụlọomeiwu nke steeti.

2. Osuji Kemas dị afọ 30, bụ ọkachamara n'ihe gbasara azụmahịa ka o si gbasa ọrụugbo, nke Bekee kpọrọ 'agribusiness consultant'.

Ọ chọrọ ịnọchite anya ndị Owerri North n'ụlọomeiwu nke steeti.

Kedụ onye ị ga-akwado?

Akụkọ ga-amasị gị