You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nigeria Elections 2019: Nwoke akụpụla nwunye ya eze maka ọ chọrọ Buhari
Otu nwoke aha ya bụ Abdullahi Yadau chụrụ nwunye ya makana ọ sị na o geghi ya ntị mgbe ọ gwara ya kwụsị ịkwado Onyeisiala Muhammadu Buhari.
Tupu nwoke a achụọ ya bụ nwaanyi, o tiri ya ihe, ma kụpụ ya eze.
Abdullahi gwara BBC na ya adịghị alụzị nwunye ya bụ Hafsat Suleiman ka ọ gwara ya na "ọ bụ Onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ ga-atunyere na ntuliaka 2019."
Ọ sị na o buru okwu a gakwuru nne na nna nwaanyị, bu ebe okwu no banye ọgụ mere o ji kụpụ ya eze.
BBC gbara mbọ nweta olu Hafsat, mana ndị be ya sọ na ọ nọghị n'ọnọdụ ikwu okwu.
Mana, nwanne ya nwoke bụ Ibrahim Suleiman kwuru na ihe a mere n'eziokwu.
Ibrahim sị na nwanne ya "agaghị alaghachi be Yadau ọzọ."
Ma kwukwa n'ihe bụzị ezigbote nsogbu n'etiti ezinaulọ ha nakwa nke Yadau.