You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
2019 Election: Lee ndị ntorobịa chọrọ ịzọ ọchịchị n'Abia steeti
BBC Igbo na-agba ndị ntorobịa chọrọ ịzọ ọchịchị n'Abịa n'anwụ tupu ntuliaka 2019 eruo.
Ajụjụ BBC Igbo jụrụ n'elu soshal midia ma 'e nwere ndị dị afọ 18-40 chọrọ ịzọ ọchịchị n'afọ 2019' mịtara mkpụrụ.
Kedụ onye ị ga-akwado n'ime ndị a chọrọ ịnochi ndị Abịa?
Ụlọomeiwu nta
1. Ejikeme Alozie-Nwagboso dị afọ 36 bụ ọgụ ego nke Bekee kpọrọ 'accountant'.
Ọ chọrọ inọchite anya ndị Ụkwa West n'ụlọomeiwu nta.
2. Adaeze Nnenne Nwokeukwu dị afọ 31 bụ dọkịta.
Ọ chọrọ ịnọchite anya ndị Isiala Ngwa North n'ụlọomeiwu nta.
Gọvanọ
Fortunes Paul Okoronkwo dị afọ 36.
Ọ bụ onye Isuikwuato chọrọ inọchi Okezie Ikpeazu dịka gọvanọ.
Ụlọomeiwu nke steeti
1. Chidinma Eni dị afọ 30 bụ onye Ọhafịa.
Ọ chọrọ inọchite anya ndị Ohafia South N'ụlọomeiwu nke steeti.
2. Victor Chinedu Ogbonna dị afọ 31 bụ ojiegoachụego.
Ọ chọrọ inọchite anya ndị Isuikwuatọ n'ụlọomeiwu nke steeti.
3. Njoku chidiebere dị afọ 29 bụ onye ọrụugbo.
Ọ chọrọ inọchite anya ndị Osisioma Ngwa North n'ụlọomeiwu nke steeti.
4. Ikenna Uchechi Ogbonna dị afọ 28.
Ọ chọrọ ịnọchite anya ndị Isuikwuato n'ụlọomeiwu nke steeti.
Cheta na nso nso a, Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ mere ka ndị ntorobịa Naịjirịa nwee ike ịzọ ọkwa ọchịchị.
Akụkọ ga-amasị gị