You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Lee ihe ụmụ Igbo sị ha ga-ekwu ma ha zute Nnamdi Kanu n'ụzọ
Nnyocha BBC Igbo mere ndị mmadụ na Facebook egosila na ọtụtụ ndị mmadụ anaghị eji Nnamdi Kanu egwu egwu.
Nnyocha a gosikwara na ebe ụfọdụ na-ahụta ya dịka 'onye amụma', ndị ọzọ na-ahụta ya dịka onye duhiere ndị mmadụ.
Cheta na nwunye Kanu bụ Uchechi Okwu-Kanu, gwara BBC Igbo na ọ maghị ebe di ya nọ.
BBC Igbo jụrụ ihe ndị mmadụ ga-agwa Kanu ma ọ bụrụ na e nwee ka ha si zute ya n'ụzọ, ha kwuru ọtụtụ ihe gụnyere na ha 'ga-eyipu uwe ha tụọ n'ala ka o nwee ike zọọ ya ụkwụ gafere'.
Cheta na ọ gafeela ọnwa 10 a hụrụ Nnamdi Kanu na nne na nna ya n'ihu ọha kemgbe ndị agha Naịjirịa gbachara "Egwu Eke" n'ụlọ ha dị n'obodo Afara Ukwu, Abịa steeti.
Ịza ajụjụ BBC jụrụ, ụfọdụ kwuru na amụma Kanu buru n'isi Naịjirịa na-abịa na mmezu.
Ndị kwụ ya n'azụ
Ọtụtụ kwụ ya n'azụ, ma kwuo na ọ ga-ebutere ha mmeri site na ime ka Biafra bịa na mmezu.
Ụfọdụ sị na ha ga-ekpere ya ekpere
Ndị akwadoghị ya
Karis Chidalu kwuru sị "M ga-ahapụ ya gafere, ọ butela ọtụtụ nkwafu ọbara nakwa mmefu ndụ ndị aka ha dị ọcha nke na-enweghị mmekwata maọlị.
Lee etu ndị mmadụ si zaa ajụjụ a na Facebook
Lekwa ihe ndị mmadụ kwuru n'Instagram: