2019 Election Campaign: Aisha Buhari o loola ọnụmmiri okwu ya?

Ihe mgbagwoju emeela dịka nwunye onyeisiala nabatara ọkwa ọhụrụ enyere ya dịka onyeisioche ga-ahụ maka achụmnta vootu di ya na ngalaba ụmụnwaanyị.

Nke a bụ n'ihi na mkparịtaụka ya na BBC ngalaba nke Awusa nwere n'afọ 2016, Aisha Buhari gbara ama na ya agaghị eso di ya chụọ nta vootu ma ọ bụ na ọ chọọ ịzọ ọkwa ọzọ.

Mana ọnụ na-ekwuru nwunye onyeisiala bụ Suleiman Haruna gọrọ na o nweghị mgbe ọbụla Aisha Buhari jiri kwuo na ya agaghị akwado achụmnta vootu di ya.

Oge BBC Igbo gara n'ihu imekwu nchọpụta maka okwu a, Maazị Haruna riri mbọmbọ ma kwuo na ya enwechaghị oge iji zaa ajụjụ a.

Nwunye onyeisiala mechakwara kwuo na-enwere ndị mmadụ ole na ole nọ n'obi ọchịchị Naijiria, bụ ndị na-chị obodo a n'aha di ya bụ Muhammadụ Buharị.

N'ajụjụọnụ BBC Igbo gbara ya site n'ekwe ntị, okwupụta okwụ nke otu Pati PDP bụ Maazị Kọla Ọlọgbọndiyan, gosipụtara mgbagwoju anya n'ihe nwunye onyeisiala ga-agwa ndị Naijiria bụ ndị ọgwaburu n'oge mbụ na onwere ndị ji aha di ya achị ala Naijiria.

Na ntụnye nke ya, onye e ji okwu ya agba izu n'okwu gbasara ọhaneze bụ, Maazị Chukwunọnye Okereke, kwuru na agwa a nwunye onyeisisala kpara gosipụtara na ọ na-erube isi, ma na-anọgidesị ike n'okpuru di ya mgbe niile, na-agbanyeghị ihe ọbụla.

Onye ga-esokwa n'isi oche achụmnta vootu a dịka ozi si n'aka okwupụta okwu nwunye onyeisiala siri dị, ga-abụ nwunye osote onyeisiala Naijiria bụ Oriakụ Dọlapọ Osinbajọ.

Ndị ọzọ ga-anọ n'okpuru achụmnta vootu a, dịka akwụkwọ akụkọ Daily Trust siri dee, bụ mmadụ ruru narị asaa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: