You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
#BabaGoSlow: Ihe mere m ji akpụ ka Ejula- Buhari
Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa asaala onyeisala Muhammadu Buhari ka o kwuchara na ọ ga-anakpụ ka eke ruo mgbe ọ natachara ego niile ndị mmadụ si n'akpa Naịjirịa zuru.
O kwuru nke mgbe ndị si obodo "Federal Capital Territory"dị n'Abuja bịara ileta ya n'ụbochị Ekeresimesi na bee ya.
Buhari onye nke ga-amlaite achụmta vootu ya n'ọdịda anayanwụ(South-South)Naịjirịa n'ụbọchị December iri abụọ na asatọ kwuru na uche ka dị na iweta ezi nchekwa, nri na ọrụ nakwa ihe ndị ọzọ ga-ezuru
ụmụ Naịjirịa.
Ụfọdụ kwuru n'elu soshal midia na ya bụ agwa ịkpụ ka eke bụ ihe mebigoro ọtụtụ ihe na Naịjirịa.
Ebe ụfọdụ na-ajụ na ọ natachala ndị otu pati APC dika Babachir Lawal eboro na ozuru ego ndị chọrọ enyemaka akpọrọ IDP n'aha ichafụ.
@oladeji_bayo gwara onyeisiala na nsogbu Naịjirịa karịrị ego ezuru ezu.
@AkaliCharles3 kwuru na ọ gbagọjuru ya anya ụwa a na-efe efe maka teknụzụ ka mmadụ ka na-ekwu maka ị kpụ ka Eke.
Mana enwere ndị kwadoro onyeisiala Buhari
@Demurleigh kwunyere onyeisiala Buhari ma kwuo na agwa ụmụ Naịjirịa gbasara ọrụ bụ nwayọ nwayọ nke na-emebi ihe.
@AnunobiKc kwuru na ọ dimma ka Buhari jiri nwayọ makana onweghị onye ọsọ n'ije nyere aka n'ọchịchị ndị jigoro ya zupu ego Naịjirịa.
@Segs_reloadedx kwuru na ọsọkwa ndị mmadụ kpọọ Buhari adịghị ndụ, ọkpụ ka Eke maọbụ ejula, a ka m kwụ ya n'azụ chịm.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: