You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Buhari: Okwu 'adịghị ndụ' bụ akaọrụ ndị iro anyị
Ụlọọrụ onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuputela na okwu ekwuru na onyeisiala Mba Amerịka kwuru nwereike ị bụ aghụghọ ndị otu ndọrọndọrọ ọchị na anọghị n'ọkwa ọchịchị kụnyere n'igwe mgbasa ozi di icheiche.
Buhari gara Amerika ị ga-aza oku Trump kpọrọ ya n'ọnwa Eprelu mana ụlọọrụ mgbasa ozi akpọrọ "Finanacial Times" depụatara na Trump katọrọ ya site na ị kpọ ya onye na-adịghi ndụ.
Mana Onye na-ekwuchitere ụlọ ọrụ onyeisiala bụ Femi Adesina kwuru na okwu a nwere ike ị bụ ụgha.
"Okwu a bụ ugha, enweghị ihe eji aka n'okwu a. Onyeọbụla nwereike ị kọ ihe ọbụla sọrọ ya," Adesina kwuru nke a in'ihe nkiri ụlọọrụ mgbasa ozi "Channels"
"Ebe ndị mmadụ na-achọ ị banye ọchichị, ha ga-emenwụ ihe ọbụla.
Ihe ndi mmadu na-ekwu maka okwu a na Soshal midia:
@Kayodespeaks kwuru na Trump nwereike ị kwu ya bụ okwu nakwa ya na-akwado ya.
@viqtoria009 kwuru na Trump bụ onye eji okwu nzuzu wee mara.
@AdamstolaG kwuru na okwu a aghaaghị ị bụ eziokwu makana ọ na-ahụ ihe na-eme n'ala Naịjirịa.
Patị akpọrọ PDP kwuru na okwu a gosiri ka ndị isiala mbaụwa niile sị ahụta Buhari.
Ha kwukwara na o gosiri na ọchịchị Buhari agbajọla ụmụ Naịjirịa.
Okwu a Fianancial times weputara na nzukọ Trump na Buhari nwere n'ọnwa Eprelu abụghị otu na nke Trump kwuru maka Buharị mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu mgbe ahụ.