You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Jim Iyke ọ dabara na nsogbu ndị uweojii?
Akụkọ pụtara ugbua na-ekwu na ndị uweojii nke ọdọ ụgbọelu Murtala Mohammed na Legọs anwụchiela Jim Iyke bụ omeiheonyonyo.
Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Punch siri kwuo, anwụchiri ya mgbe ọ mara onye ụlọọrụ ọla mgbe ọ na-achọ ị me ya nyocha.
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ọ mara nwoke ahụ ọra ebe ọ na-achọ ịnyere ya aka mee ọsịsọ banye n'ụgboelu njem ya tupu ihe a eme.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị ụlọọrụ Dana Air bụ Kingsley Ezenwa kwuru na ihe a mere ma kwuo na atọghapụọla Jim Iyke dịka ọ rịọrọ biko.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na ọdọ ụgbọelu bụ Alabi Joseph kwukwara na atọghapụọla ya bụ omeiheonyonyo.
Jim Iyke agaghịzi njem ya n'ihi okwu a.