You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Lee ihe ndị Buhari na Trump kpara
Buhari bụ onyeisiala ojii nke mbụ ị ga leta Trump kemgbe ọ rịgoro ọkwa ọchịchị n'afọ 2017.
N'akụkọ kachasị ha kpara bụ maka nchekwa na ị luso ndị na-eyi ndụ egwu bụ Boko Haram agha.
Buhari kelere Trump maka enyemaka ndị mba Amerịka na-enye ha n'ịlụ ọgụ a ma sị kwa ya ndewo maka ihe ọ na-eme ị bugote akụnaụba mba Amerịka
O kwere Trump nkwa na ya na ndị agha Naịjirịa na-agba mbo ị gbapụta ụmụakwụkwọ ndị Chibok atọrọ n'afọ 2014.
Lee ihe ndị ha kpara n'uju ebe a:
Akụnaụba mba abụọ
Trump kwuru na o nwere olileanya na Naịjirịa ga-agbanwe ụfọdụ iwu ha iji nye mba Amerịka ohere ị bubata ngwa ahịa ha dị ịcheịche n'ala Naịjirịa.
Okwu nchekwa:
Trump na-ekwu kwa na ya ndị gọọmentị ya ka enye ka hụ na emeriri agha Naịjiria na-ebuso ndị Boko Haram agha. O kwuru na ya ga enye Naịjiria ụgboelu agha iji lụ ọgụ a.
Buhari kelere ya maka nke a.
Trump kwuru "Ezigbo nsogbu dị na Naịjirịa ebe a na-egbu ndị ụka Kraịst, Anyị ga-etinye uchu n'ime nsogbu ahụ maka na anyị agaghị ekwe ka nke ahụ mee.
Ị gba ngbere mmadụ:
Okwu a dị mkpa maka na a na-aghọgbu ọtụtụ ụmụnwaanyị Naịjirịa ma kpọfe ha n'ala Amerịka iji ha mere ohu
Trump sị na ọ ga-arụ ọrụ ị hụ na akwụsiri ihe a maka kachapụ ya n'akụkọ a na-anụ maka Naịjirịa.
O kwụkwara na ọ ga-amasị ya ị bịa leta ala Naịjirịa n'oge adịghị anya maka na ndị mmadụ na-agwa ya na Naịjirịa bụ ala mara mma.