You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: Imo na Delta ga-enwe ọdọ mmanụ agbidi
Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a:
Imo steeti na Delta steeti esonyela na steeti ebe a ga-enwe ọdọ na-arụpụta mmanụ agbidị na Naịjiria.
Minista na-ahụ maka ihe gbasara mmanụ agbidi bụ Ibe Kachikwu bụ onye kwuru nke a ebe a na-agbape ọdọ ọhụrụ na Bayelsa.
O kwukwara na ihe a ga ewetara ndị ntorobia Naịjirịa ọrụ.
N'ebe ọzọ...
Otu ụlọịkpe amaala onye ọkaiwu bụ Joseph Nwobike so na otu ndị ọkaikpe akpọrọ SAN n'aha ịchafụ ikpe maka ebubo mgbochi ikpe zuru ezu.
E nwereike ị napụ ya ịkịke ị bụ onye ọkaịwu ukwu maka okwu a dịka esi mee Emeka Ugwuonye n'oge gaara aga.
Na mba ndị ọzọ:
Onyeisiala Naịjirịa Muhammadu Buahrị na onyeisiala mba Amerịka ga-enwe mkparịta ụka ma ha mechaa nzụkọ ịme ụlọ ebe 6:30 nke mgbede a
Cheta na Buahri gara njem ị leta onyeisiala mba Amerịka taa
N'egwuregwu
Otu Rangers nke Enugu nwere ike ị ku-ume ugbua ebe ha ji ọkpụ ato asataghị otu merie Wikki Tourist nke kwara ụnya ahụ
Mmeri a ebugola ha n'ọkwa ise na NPFL nke Naịjiria.
Ihe ndị ọzọ ị kwesiri ị ma:
Otu onye ntaakụkọ BBC anwụọla na Afghanistan.
Ahmad Shah dị afọ ịrị abụọ n'ịtoolụ nwụrụ mgbe a wakporo ebe ọ nọ n'obodo Khost na Afghanistan. Ndị isi na BBC ka na-enyocha ka a mara ihe mere n'okwu a.
Gee nkeji nke mgbede a ebe a:
Ihe onyonyo nke taa: