Amina Zakari: Onye sị na abụ m nwanne Buhari bịa gosi ihe akaebe

Aha onyonyo, Okwu Amina Zakari banyere ihe jikọrọ ya na Buhari
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Amina Zakari, onye ụlọọrụ INEC họpụtara dịka onyeisi kọmitii ga-achịkọta vootu na ntuliaka 2019 ekwuola na ya onyeisiala Muhammadu Buhari abụghị nwanne.

Na mkparịtaụka ya na BBC nwere na Fraide, Zakari gọrọ na akụkọ na-efegharị kwuru na ya bụ nwa nwanne Buhari bụ ụgha.

Zakarị sị, " Abụghị m nwa nwanne ya. Abụghị m nwa nwa nna ya. Ọbụghị nwanne nna m"

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ Goodluck Jonathan tinyere ya n'ọrụ n'afọ 2010.

Cheta na ọtụtụ otu gụnyere PDP, Ohaneze, Oby Ezekwesili, na ọtụtụ ndi ọzọ tiri mkpu n'abalị Tọsde mgbe INEC wepụtara aha Amina Zakarị dịka onye ga-anọ n'isi ndị ga-ekpokọba ọnụọgụ vootu nke ntuliaka na-abịa.

Ọkammuta Mahmud Yakubu, bu onyeisi oche INEC bụ onye kpọrọ aha Amina Zakari dịka onye ga-ahazi ntuliaka nke onyeisiala a ga-eme n'ụbọchi 16 nke ọnwa Febụwarị.

Mahmud Yakubu

Ebe foto si, @inecnigeria

Nkọwa foto, Onyeisi oche Inec bụ Mahmud Yakubu họpụtara Amina Zakari dịka onyeisi ndị ga-achịkọta vootu na ntuliaka 2019

Nkatọ PDP, Ezekwesili na ndị ọzọ nwere maka ihe INEC mere bụ na Amina Zakari bụ "Nwanne Buhari".

N'uche ha, kedụ etu nwanne Buhari ga-eji nye ohere ka ntuliaka a gaa nkeọma dịka onye aka ya kwụ ọtọ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ọnụ na ekwuru Onyeisiala Buhari bụ Garuba Shehu kwuru na Zakari abụghị ọbara Buhari kama e nwere alụmdịnakwunye n'etiti ezinaụlọ ha abụọ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na nna Amina Zakari bụ Husaini Adamu, bụbu Eze Kazaure bụ obodo dị na Jigawa state, nụrụ nwanne Buhari.

Nke pụtara na nwanne Buhari nwaanyị bu nwunye nna Amina Zakari.

Onye bụ Amina Zakari?

Amina Bala Zakari

Ebe foto si, INEC

Nkọwa foto, Amina Zakari

Amina Bala Zakari, bu nwa Eze Kazaure.

Di ya bụ Bala Zakari, bụkwa onye Kazaure, mana ya na nna Amina anala mmụọ.

Zakari dị afọ 58, rụrụ ọrụ ka onye nọchịte anya onyeisi oche Inec mgbe Attahiru Jega rituru n'afọ 2015.

Ọ ya bu nwaanyi mbụ rụrụ ọrụ dịka onyeisi Inec.

Zakari gara akwụkwọ prịmarị na Kano steeti.

Mahadum ya bu na Ahmadu Bello Univeristy Zaria.

O ji asambodo dịka onye mgwakọ ọgwụ Bekee kpọrọ "Pharmacist"

Nna ya na-anu onye tọrọ Onyeisiala Buhari.

N'afọ 2011, Onyeisiala Goodluck Jonathan nyere ya ọkwa dịka "Inec National Electoral Commissioner"

Ọ rụrụ ọrụ na PTF.

Ọ rụkwara ọrụ dịka onye enyemaka Obasanjo site 2004 ruo 2007.

Onye bu ụzọ kwuo maka etu Amina Zakari siri metuta Buhari bụ Tanko Yakassai n'afọ 2015.

Yakasai mechara sị na ọbụghị ihe okwuru ka ụlọntaakukọ Tribune dere na mkparịtaụka ha wepụtara n'ụbọchị itoolu nke Sepụtemba 2015.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ