You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
#WalkofWomen: Etu Oby Ezekwesili si chụ nta vootu n'Anambara
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Oby Ezekwesili gwara ndị Anambra steeti na obi dị ya ụtọ etu ha si nabata ya n'etiti ha.
O jikwa ohere ahụ were kwuputere ha ka ọ ga-esi mee ka ndụ dịrị ha mma ma ọ banye oche ọnyeisiala n'afọ 2019.
Ezekwesili bidoro atụmaatụ akpọrọ "#walkofwomen" iji wee mee ka ụmụ Naịjirịa ghọta mkpa ọ dị ịgbapụta Naịjirịa n'aka ndị nọ ọchịchị ugbua na ntuliaka 2019.
O buru ya bụ atụmaatụ gawa Onicha ma bie ije na All Saints Primary School Onichaa.
Oby kwuru na njem a dị ya ezigbo mkpa makana o na-enye ya ohere ịmata ụmụ Naịjirịa ọfụma.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: