You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Nne bịa goro m ahịa' ebutela okwu n'ime ahia Yaba dị na Lagos
Ị gatụla ahịa ndị mmadụ a na-adọkasị gị ahụ maọbụ na-ebikasị gị aka? Lee ihe mere ka ndị mmadụ gara ahịa Yaba igosi iwe ha maka akparamagwa a.
Ọtụtụ ndị mmadụ ọkachasị ụmụnwaanyị ga-agwa gị na ihe mere ha ji asọ nsọ ịga ahịa azụta ihe bụ maka etu e si adọgharị ha n'aka ebe a ana-asị ha bịa gote ihe.
Ndị otu kpọrọ onwe ha "Market March", gara n'ahịa Yaba dị na Legọs, igosi etu o dị ha n'obi gbasara ya bụ ndọgharị aka ụmụnwoke na-adọ ụmụnwaanyị n'ahịa.
@amaka_sandra1 kọwara etu ụfọdụ ndị si metụkwa ya aka n'ebe ọ gara ikwu ka akwụsị ndọgharị aka a na-adọ ụmụnwaanyị n'ime ahịa.
@Sopzn kwuru na etu ndị mere ngagharịiwe si mee ya abụghị etu ha kwesịrị isi mee ya. O kwuru na ha gara ahịa ịkparị ụmụnwoke na-agụghị akwụkwọ, kama ikuziri ha etu ha ga-ezi na-akpa agwa ọfụma.
O kwuru na ihe a ụmụnwaanyị a mere n'ahịa mere ka ha yie ndị iberibe.
@Dikachim kwuru na ọ bụghị naanị ndị nọ n'ahịa na-eme ụmụnwaanyị ihe a, na ọtụtụ ụmụnwoke na-emekwa ya n'ụlọọrụ dị iche iche.