Anambra Mortuary Fire: 'Anyị ahọpụtawala ozu iche iche" - Gọọmentị Anambara

Gọọmentị Anambara gwara BBC na ha amalitela usoro ịhọpụta ozu 'nke bụ nke' n'ime ihe ruru iri ise gbara ọkụ n'otu ụlọozu dị n'Enugwu Ukwu.

Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi na steeti ahụ bụ Don Adinuba gwara BBC Igbo na ọkụ gbagburu ozu ruru iri na ise.

Ọ kwukwara na kọmishọna na-ahụ maka ahụike bụ Joe Akabuike na ndị ọrụ ụlọ ozu azụrụ azụ n'ụlọ ozụ ahụ ahọpụta ozu "nke bụ nke".

BBC Igbo kpọkwara Akabuike onye kwuru na ọ nọ na ya bụ ụlọ ozu ugbua.

O kwuru na ihe butere ọkụ ahụ bụ ahịhịa na-agba ọkụ n'akụkụ ụlọ ozu ahụ.

N'ọnụ ya, "m na ndị ọrụ ụlọ ozu họpụtacha ozu niile a mara nke bụ nke ,ma detuo nchọpụta anyị ọfụma, anyị ebunyewe ya ndị nwe ozu."

"Anyị ga-eji nyocha DNA were chọpụta ozu gbarisiri nke bụ nke."

Cheta na Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Anambara steeti kwuru na ọkụ ahụ gbara ọzu niile dị n'ụlọozu ụlọọgwụ gọọmeti dị n'Enugwu-Ukwu.

O depụtara na akwụkwọ ozi o degara onye ntaakụkọ anyị na ha amabeghị ihe kpatara ya bụ ọkụ.

O kwuru na CSP EGU Benjamin si ngalaba uweojii na Nimo du ndị uweojii na-akpagharị n'obodo gawa ebe ihe ahụ mere.

Ha gbochiri ọtụtụ mmadụ ịbanye ebe ahụ ga-azuru ihe ndị mmadụ ma kpọkwa ụlọọrụ na-emenyu ọkụ biara menyụọ ọkụ ahụ.

Mohammed kwuru na ozu niile dị ebe ahụ gbatọrọ agbatọ n'ụzọ mmadụ enweghị ike ịmata ozu onye ọwụ.

O kwuru na ruo ugbua ha mabeghị ihe butere ọkụ ahụ mana ya ndị otu ya na-enyocha ihe niile mere ebe ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị