Ipob sị ndị otu ha nọrọ n'ụlọ ụbọchị a ga-eme ntuliaka nke 2019

Ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) agwala ndị otu ha niile ha nọrọ n'ụlọ mgbe a ga-eme ntuliaka nke 2019.

Onye kwuru nke a bụ Ukochukwu Udochukwu Peace mgbe ya na BBC nwere mkparịta ụka ụtụtụ Satọde.

Peace sị na ọ bụ ụzọ ha ga sị mee ka onye ọbụla kpọro ọnwe ya nwa Biafra ghara iso ga ya bụ ntuliaka n'afọ ọzọ.

Ọ sị n'Ipob ekpebịelarị kemgbe na ha agaghị eso eme ntuliaka ahụ bụ nke ha sị na-onweghị isi.

Na olụ ya, "ị na-eme ihe ị na-eme kwa afọ anọ na-atụ anya ịnwete mpụtara dị iche, onwe gị ka ị na-aghọgbụ."

Ọ sị na ihe a bụ ụzọ ndị ọbụla na-ebu agha mnwere onwe ga-eso ka ụwa mara na ha kpọrọ ya ihe.

Akụkọ ga-amasị gị