Australia ekwetala na West Jerusalem bụ isiobodo Israel

Praịm Minista mba Ọstrelia bụ Scott Morrison ekwuola na gọọm̀entị ya ekwetala na West Jerusalem bụ isiobodo Izrel.

Mana o kwukwara na ha agaghị ebufu isiụlọọrụ ha na Tel Aviv ruo mgbe a ga-enwe ezi mkpezi ebe ahụ.

Ọ sịkwa na n'ezie na gọọmentị ya nabatakwara na-ọdị mkpa ndị Palistaịn ịnwete mba nke ha ga-eji East Jerusalem mere isiobodo.

Okwu gbasara Jerusalem so na ọkpụkpụ gbadoro n'olu amaghị ka a ga-eme n'ihe gbasara esemokwu Izrel na Palistaịn.

Ndị ụwa kpụ ọnyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump n'ọnụ n'afọ gara aga mgbe ọ sị na ya anabatala Jerusalem dịka isiobodo Izrel.

N'ọnwa Mee ka Trump bufere isiụlọọrụ mba Amerika Jerusalem.

Ihe a Trump mere bụ ihe nyịrị ndị ọchịchị mba Amerika ndị ọzo ọmụme.

Kedụ ihe Onyeisiala Ọstrelia kwuru?

Scott Morrison kwuputara nke a ka ya na ndị ọnụ na-eru na okwu na mba Ọstrelia nakwa mba ụwa gbachara izu.

Okwuru na Sydney ụbọchị Satọde na " Ọstrelia anabatala na West Jerusalem bụzi isiobodo Isrel."

"Anyị ga-ebufee isiụlọọrụ anyị dị na mba Izrel na Jerusalem mgbe akpabiri ụka esemokwu dị na mba abụọ a."

Ka ọ dị ụgbụa, Morrison sị na Ọstrelịa ga-amalite mmekọ maka nchekwa na azụmahịa na West Jerusalem.

Praịm Minista kwukwara na Ọstrelia nakwa akwado ọchịchị onye kwuo uche ya n'obodo ndị Arab gba gburugburu.

Mgbe amalitere mkparịta ụka a na ọnwa nke iri n'afọ a, ndị Palistịan anabataghị ya ebe obi bụ ndị Izrel sọ ọṅụ.

Onye Morrison na-eso n'ọchịchị bụ Malcolm Turnbull anabataghị atụmatụ a ma ọlị.

Akụkọ ga-amasị gị