You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Vice Presidential Debate: Ka o si gaa
Dị ka a na-akwado ntuliaka onyeisiala Naịjria nke 2019, ndị na-azọ ọkwa osote onyeisiala na-azara ọnụ ha gbasara ihe ha ga-eme ma ha banye ọchịchị.
Ndị gụnyere Yemi Osinbajo (APC), Peter Obi (PDP), Umma Getso (YPP), Khadijah Abdullahi-Iya (ANN) na Ganiyu Galadima (ACPN) na-eme nrụrịtaụka a ndị Channels Tv hibere.
Osinbajo nke APC kwuru na ọchịchị ha amalitela ịrụ ọtụtụ ihe owuwu nke bụ nke a kacha arụ kemgbe mbido mba Naịjirịa.
O kwuru na a na-arụ opekatampe, otu ụzọ gbara ọkpụrụkpụ na steeti niile dị na Naịjirịa.
Obi nke PDP, kwuru na Naịjirịa so na mba ebe a kacha nwee ndị nọ n'ụbịam nakwa ụmụaka anaghị aga ụlọakwụkwọ, na mbaụwa.
O kwukwara etu Naịjirịa si bụrụ onye nke atọ na mba ndị na-eyi ndụ egwu kacha.
Obi kwuru na ọ bụrụ na gọọmentị ewepụtaghị ohere ga-eme ka ọrụ gbaa kasa, ma mee ka ọnụọgụgụ ndị ntoroọbịa na-enweghị ọrụ gbadalata karịa ka ọ dị ugbua, na Naịjirịa ga-enwe nsogbu.
O tinyekwara ọnụ n'ihe gbasara ego gọọmentị kwesịrị itinye n'ọrụ ndị na-etolite etolite.
Galadima nke ACPN kwuru na site na 2015 ruo ugbua, na ọchịchị adịbeghị mma karịa etu ọ na-adị na mbụ.
O kwukwara na enweghị aka ọrụ akala etu ọ ha mbụ, ma kwuo na ọ bụ maka ụkpụrụ ọjọọ gọọmentị tinyere.
O kwukwara na gọọmentị na-etinye ego enyemaka Ijeri abụọ kwa ụbọchị n'elu mmanụ a mịpụtara n'ala.
Abdullahi-Iya nke ANN, kwuru na e kwesịrị itinye anya n'ihe gbasara ụmụaka na ụmụnwaanyị na Naịjirịa, na ọ bụ ya ga-eme ka ọdiniihu ụmụaka a bụrụ ihe e chekwara echekwa.
O kwukwara na mpụ na nrụrụaka juru n'ihe gbasara ụgwọ enyemaka gọọmentị na-akwụ maka mmanụ a mịpụtara n'ala.
Getso nke YPP kwuru na ọ gaala ebe ndị ụbịam nọ na Naịjirịa, wee hụ etu ndị mmadụ si ata ahụhụ.
O kwuru na pati ya kwenyere na onye Naịjirịa niile nwere ikike.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: