APC na INEC ga-agwa ụlọikpe ihe mere ha ejighị nye Hope Uzodimma ọkọrọtọ ịzọ ọkwa gọvanọ n'Imo
Akụkọ dị mkpa taa

Ebe foto si, HOPE UZODIMMA FACEBOOKPAGE
Ụlọikpeakpọkụọla APC na INEC
Ụlọikpe ụkwụ dị n'Abụja akpọkụọla APC na INEC ha bịa kwuo ihe ha agaghị eji nye Hope Uzodimma ọkọrọtọ dịka onye ga azọ ọkwa gọvanọ n'APC Imo Steeti.
Ụlọikpe a nyere APC na INEC mkpụrụ ụbọchị abụọ maka ịza oku a, maọbụ...
Obasanjo ọ gbagharala Atiku?

Ebe foto si, @atiku
Akụkọ na ekwụ na onye bụ ọkọrọtọ PDP na ntuliaka 2019 bụ Atiku Abubakar na ọga ya Olusagun Obasanjo nwere nzụkọ mmechi ụzọ n'ehihie a.
Atiku na Obasanjo adịchaghị mma kemgbe ha hapụrụ ọchịchị na 2007 mana Obasanjo kwuru na ọgbagharala ya.
N'ofesi

Ebe foto si, AFP
A tọrola otu aka jiakụ nwa mba Tazania na ụlọ ọṅụṅụ na nkwarị dị an Dar es Salaam isiobodo mba ahụ.
Aka kpaara Mohammed Dewji n'isi ụtụtụ a mgbe ọ sị ịgbatị ọkpụkpụ pụta na hotel ya. Ndị uweojii ka na ama imi n'ala ịmata ndị kpara arụ a.
N'egwuruegwu,

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi oche Aston Villa bụ Sir Doug Ellis alakwurula ndị nna ya ochie mgbe ọ dị afọ iri itoolu na anọ (94).
Ellis sị na ọche eze dịka onyeisi oche Aston Villa ridaa n'afọ 2006. Ka mkpụrụ obi ya zuo ike na ndụkwa maọbụrụ na mkpụrụ obi na-ezuike n'ezie.
Gee Nkeji nke mgbede a:
Lee ihe nkiri nke taa
Cristiano Ronald kana agọrọ isi ya

Ebe foto si, Getty Images
Cristiano Ronaldo ka na-agọ ụkwụ na aka na onweghị mgbe ya kwasara Kathryn Mayorga iko n'ike n'afọ 2009.
Ọkaiwu Ronaldo na ekwusi ike na akwụkwọ nịịle eji ebo Ronaldo ebubo ahụ bụ nkonukọ ka ekonụkọrọ ha.
Gọmenti etiti akpụpụla Ekweremadu ụlọikpe

Ebe foto si, @ike_Ekweremadu
Gọmenti etiti akpụpụla osote onyeisi Sinete bụ Ike Ekweremadụ na onye nnọchite anya Akwa Ibom North East bụ Baseey Akpan ụlọikpe.
A na-ebo mmadụ abụọ a ebubo ha na ha ekwuchaghị ka ọ ha ha tupu ha bata n'ọchịchị.
Onye ọbụla nwere akụnaụba n'ofesi ga-akwụ ụtụisi

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Muhammadu Buhari etinyela aka n'akwụkwọ iwu ga-eme ka ihe taara onye Naịjirịa ọbụla nwere akụnaụba na mba ofesi akpụ.
Atụrụ anya na onye nwere akụnaụba dị otu a ga-ekwuputa ya na ihe akarịghị otu afọ ma kwụọ otuisi so ya. Onye ọbụla mere otu a ga-erite erere pụrụiche.
Hurrican Michael akpaala mkpamkpa n'US

Ebe foto si, Getty Images
Ajọ ifufe akpọrọ Hurricane Michael ji oke ọsọ ruru kilomita narị abụọ abatala na Florida na mba Amerika.
Ka ọ dị ugbua, otu onye anwụọla na ya bụ oke ifufe bụ nke mebiri ọtụtụ akụnaụba ndị mmadụ.
Gee Nkeji nke ụtụtụ a:
Lee ihe nkiri nke taa














