You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Fada Katọlik sị na igbochi afọime megidere iwu Chukwu
Taa bụ ụbọchị mbaụwa na-eme emume gbasara ụzọ dị icheiche e ji egbochi afọime oge mmadụ achọghị ya.
Ihe ndị a bụ ihe a na-akpọ 'World Contraception Day' na Bekee.
E ji ụbọchị taa agbasaozi gbasara mkpa ọ dị ụmụnwoke na ụmụnwaanyị na-enwe mmekọrịta anụ ahụ ịmata ụzọ dị mma iji gbochie afọime ghara inwe nsogbu ahụike.
Ụfọdụ ngalaba dị icheiche na okpukpe dị icheiche machiri igbochi afọime na ime ihe ga-akwụsị nwaanyị itu ime.
Ihe ụka Katọlik kwuru
Ngalaba ụka Katọlik kwenyere ka di na nwunye mụta nwa oke ha ga-azụlị mana ha ga-agba mbọ hụ na ha egbochighi afọime ọbụla.
BBC Igbo gbara Fada Ọkammụta Edwin Obimma Ezike ajụjụ gbasara ihe ụa Katọlik kwuru maka igbochi afọime.
Fada Ezike kwuru na ụka Katọlik akwadoghi ka nwaanyị kwụsị afọime ọbụla nwoke gbanyegoro ya n'ahụ.
O kwuru na nke a bụ maka na oge mkpụrụ nwoke banyere nwaanyị n'ahụ, mkpụrụ ahụ na akwa nwaanyị bịakọọ ọnụ, ndụ amalitela nke bụ na ihe ọbụla e mere ịkwụsị ndụ ahụ bụ imemina mmadụ.
Lee ihe Fada Ezike kwuru ebe a:
N'akụkụ nke ya, dibia Bekee bụ ọkammụta Uche Nwagha, bu ọkammụta n'ihe banyere ọmụmụ nwa na ụmụnwanyi, gwara BBC Igbo na ọ dị mkpa na nwaanyị gbochiri ime oge ọ na-achọghị ya.
O kwuru n'ezie na ndị ụka anaghị anabata ya mana ọ bụ ihe dị mkpa iji hazie ezinaụlọ na ụmụ ole di na nwunye chọrọ ịmụta.
Uru atọ igbochi afọime bara
Ọkammụta Nwagha gụpụtara ụfọdụ uru dị icheiche igbochi afọime bara.
Ha bụ:
- Igbochi afọime ga-eme ka di na nwunye mụta ole ha ga-azụlị
- Igbochi afọime ga-eme ka nwaanyị ghara ịmụ nwa mberede
- Igbochi afọ ime ga-echekwa nwaanyị ma nye ohere ka nwaanyị doo ahụ ma ọ mụchaa nwa tupu ọ dị ime ọzọ
- Igbochi aafọime nwereike ịzọ nwaanyị ndụ ọkachasị ọ bụrụ na nwaanyị nwere oke ọrịa ọ na-arịa dịka kansa ara, maọbụ ọrịa obi.
Lee ihe ọkammụta ahụ kwuru ebe a:
Ezie, ndị ụka ekwenyeghi n'igbochi afọime mana ha nwereike ịnabata ya naanị oge ọ na-amaja ndụ nwaanyị.
Dịka Fr. Ezike siri kwuo; "N'oge a, anaghị egbochi afọime kama, a na-azọ ndụ."
Nke a pụtara na ọbụrụ na nkwenye mmadụ ekweghi ka o gbochie afọime, ọ ga-akpacha anya oge ọ na-emetụta ndụ ya,