You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Lee ụdịrị ihe ndị e ji eme nturugo na mahadum Naịjirịa
O nwere ihe o mere ma e nye ndị mere ọfụma na mahadum ihe nrite dịka ji, ewu, ọkụkọ na ego na-enweghi ebe o ruru eru?
Ọtụtụ oge ka ndị mmadụ na-ewe iwe sị "gịnị kpatara a ga-eji nye ndị kachasị mara akwụkwọ na mahadum obere ego, ma bunye ndị mere ihe nkiri dịka "Big Brother" nnukwu ego nde kwụrụ nde?
Ụfọdụ ndị Naịjirịa kwuru na ha aghọtaghị ihe mere a ga-eji na-enye ndị na-aga asọmpi ndị dịka nke a na-agụ egwu, ihe nkiri nakwa ihe ndị ọzọ ọtụtụ ego.
Ha kwuru na ha amaghị ihe mere a ga-eji nye ndị mere ọfụma n'ihe gbasara ịgụ akwụkwọ ihe ndị na-enweghi ebe o ruru eru.
Ihe e nyere ndị mere ọfụma n'akwụkwọ
Ezinne Okeke bụ onye nwetara ji nakwa iko agwa ole na ole kwuru na obi dị ya aṅụrị.
Onye ọzọ bụ @ty_Fregz kwuru na e nyere onye ya na ya gụkọrọ akwụkwọ bụ Omubo Joy naanị narị naịra abụọ na iri ise (N250).
Akụkọ kwukwara na onye kachasị mee ọfụma na mahadum Ọshụn steeti n'afọ 2016 nwetara naanị iko.
@DirectorSolomon tinyere na Twitter na onye kachasị mee ọfụma na 'Medicine and Surgery' na mahadum Nsukka nwetara naanị puku naịra iri (N10,000).
@TrendsOfNigeria kwuru na onye ọzọ bụ Chinelo Okafor nwetara puku naịra iri abụọ na isii (N26,000) oge nke ya.
Nke @Pius_Ojemolon dị ka ọ kacha njọ, makana o kwuru na o nwetebeghi ego niile ekwere ya na nkwa ka otu afọ na ọnwa ise gachara kemgbe ọ pụtara dịka onye kachasị mee ọfụma na mahadum ya.